Mosquito Bites: Lee ihe asaa mere ahụ gị ji adọta anwụnta karịa ndị ọzọ

Ọtụtụ oge ka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na anwụnta anaghị ekwe ka ha tinye ụra n'anya.

Mana ndị ọzọ nọkwa n'otu ebe ahụ anaghị aghọta ihe ha na-akọ n'ihi na anwụnta anaghị ata ha.

Nke a bụ maka na ndị ahụ ha na-adọta anwụnta karịa ndị ọzọ.

Ihe na-akpata anwụnta ji agakwu ụfọdụ ma na-agbara ụfọdụ ọsọ dị icheiche.

Nnyocha Sayensị gosiri n'ezie na ọ bụghị mmadụ niile ka ahụ ha na-amasị anwụnta.

Lee ihe asaa mere ahụ gị ji atọ anwụnta rịrịrị nke mere i ji bụrụ ezigbo enyi ya:

1) Agwa (Colour)

Nnyocha egosila na anwụnta na-achọkarị ebe gbara ọchịchịrị karịa ebe nwere nnukwu ihe.

Nke a pụtara na anwụnta ga-aka agakwu onye yi uwe ojii maọbụ uwe na-anaghị amuke amuke.

Ọ bụrụ na i yi akwa ojii, o nwere ike bụrụ ihe na-adọtara gị anwụnta.

2) Ọsịsọ (Sweat)

Ọ bụrụ na i nwere ahụ na-agba oke ọsịsọ, mara na gị na-anwụnta ga-abụ nnu na mmanụ.

Nke a bụ maka na nnyocha gosiri na ebe na-ekpo ọkụ ma nwee mmiri, na-amasị anwụnta nke ukwuu.

Chetakwa na ọsịsọ nwere isi ọ na-ewepụta n'ahụ mmadụ nke nwekwara ike ịdọta anwụnta.

3) Mmanya na-aba n'anya (Alcohol)

Na 2020, ndị ọkachamara mere obere nnyocha nke gosiri na anwụnta na-aka agakwu ndị ṅụrụ mmanya na-aba n'anya, ọ kachasị nke bekee na-akpọ 'beer'.

O dochaghị anya ihe kpatara nke a, mana a na-eche na o nwere ike ịbụ maka isi ya.

4) Ụdị ọbara

Nnyocha gosiri na ndị nwere ụdị ọbara O na-aka amasị anwụnta karịa ndị nwere ụdị ọbara A maọbụ B.

Iji mee nnyocha a, e tinyere mmadụ ole ma ole n'ime otu ọnụ ụlọ, mana anwụnta tara ndị nwere ụdị ọbara O pasentị 83, ebe ọ tara ndị nke ọzọ pasentị 46.5.

Mana a ka na-eme nnyocha iji mata ihe kpatara nke a.

5) Onye dị ime

Dịka ụfọdụ nnyocha siri gosi, ahụ ụmụnwaanyị dị ime na-aka amasị anwụnta karịa ndị na-adịghị ime.

Nke a nwereike ịbụ maka maka na ahụ nwaanyị dị ime na-ekpotụ ọkụ karịa onye nke adịghị ime.

Ụmụnwaanyị dị ime na-akakwa ekuputa ikuku 'carbon dioxide' karịa.

Ụdị ikuku a na-amasị anwụnta nke ukwuu.

6) Mgba isi ọma (perfume)

Cheta na enwere okooko (flower) na-amasị ụmụanwụnta ifega.

Chetakwa na ọtụtụ mgba isi ọma bụ okoko ndị nwere isi ọma ka e ji emepụta ha.

Ọ bụrụ na ụdị mgba isi ọma nke ị gbara na-ahụ gị bụ ụdị nke e ji okoko na-amasị anwụnta mepụta, mara na gị na anwụnta ga-abụ enyi n'ụbọchị ahụ.

7) Ahụ isi

Ihe na-akpata ahụ mmadụ ji esi isi, maọbụ 'body odour' na bekee, bụ ihe anaghị ahụ anya nke bekee na-akpọ 'micro organisms'.

Ihe ọzọkwa bụ mburupụtaụwa bekee kpọrọ 'genetics'.

Ọ bụrụ na mmadụ nwere ahụ isi, anwụnta nwere ike ị na-abịakwute ya karịa.

Nke a bụ maka na anwụnta na ụmụ 'micro organisms' ụfọdụ na-akpata ahụ isi na-adị na mma.

Ihe ị ga-eme iji belata anwụnta ịhụ gị n'anya:

  • Chọọ ude pụrụ iche na-achụ anwụnta; bekee na-akpọ ya 'mosquito repellent'.
  • Na-eyi akwa nwere ogologo aka ma ọ bụrụ na ị nọ n'ogbe anwụnta dị nnukwu.
  • Na-eyi akwa na-achake achake. Zeere akwa ojii.
  • Wepụ ebe anwụnta nwere ike ịnọ na-amụba n'okirikiri gị, dịka ọdọ mmiri, ahịhịa na ihe ndị ọzọ.
  • Mechie ụzọ na mpio ka anwụnta ghara ịbata.