Buhari in Imo state: "Anaghị akpachapụ ndị Igbo" na ihe ndị ọzọ onyeisiala kwuru n'Imo

Onyeisiala Muhammdu Buhari toro onwe ya n'okwu o kwuru n'ụbọchị Tọọzde n'Imo Steetị ebe ọ bịara mee njem nleta ọrụ sị na ọha ga-echete ya dịka onyeisiala chụpụrụ mpụ ma weghachite nchekwa na ọganihu n'ala Naịjirịa.

O kwukwara na anaghị akpapụ ndị Igbo n'ala a, dịka ndị Igbo bụ ndị kacha akwado akụnaụba ala Naịjịrịa ma bụrụ ndị nọ n'isi ọrụ na mpaghara Naijịrịa niile.

Lee ọkpụrụkpụ ihe ndị ọzọ o kwuru na njem nleta ya n'Imo Steetị

Maka nchekwa na Naijịrịa

"Ọ bụrụ na nchekwa adighị ọnweghi atụmatụ ọganihu ga adị ire, nchekwa bụ ihe kachi mkpa. Nchekwa dị na obodo ndị mmadụ nwere ike izu ahịa ma rụọ ọrụ aka n'udo"

Maka ịkpakọrọ ọnwe ya akụnaụba

"O nweghi onye nwere ike ịrụ m aka na nwere ụlọọrụ nke m maọbụ oke ụlọ na mpaghara Naijịrịa niile. Ekele diri chukwu na aka m dị ọcha ya mere o nweghi onye ga atali m ụta mpụ ọbụla"

Maka ikwado ọganuihu ndị Naijịrịa

"A ga m agbasi mgbo ike ihu na onye ala Naijịrịa ọbụla na arụsi ọrụ ike ga erite ụgwọ ọrụ ya"

Maka okwu mkpapụ na mmegbu ndị Igbo

"Ọ na-agbagwoju m anya ma onye Igbo ọbụla si na a na-akpapụ ya n'ala Naijirịa"

"Eziokwu gbara na-anwụ bụ na ndị Igbo bụ ndị kacha akwado akụnaụba ala Naịjịrịa ma bụrụ ndị nọ n'isi ọrụ na mpaghara Naijịrịa niile"

"Ọ nweghi mpaghara Naijịrịa ọbụla ị ga-aga ị gaghị ahụ onye Igbo ka ha nọ isi ọrụ, na agba mbọ maọbụ opekata mpe ha enwe ụlọ a na-ere ọgwụ"

"Ndị Igbo bụ ndị kacha erite uru ọrụ iwulite obodo n'ala Naijịrịa maka ọ bụ ha kacha agba mbọ"

Na njem nleta a, Onyeisiala Buhari mepere ọrụ ọhụrụ anọ n'Imo Steetị nke gụnyere:

•Mmepe okporo ụzọ jikọrọ mpaghara Naze/Ihiagwa/Nekede/Obinze

•Ọwa mmiri ga -akwusi ide mmiri n'ụzọ Dick Tiger nke Bekee kpọrọ " the Balloon Driven/Flood Control drainage"

•Okporo ụzọ ebe Egbeada

•Obi gọọmentị ọhụrụ nke akpọrọ " Exco-Chambers"

Lee ndị a ma ama na-abịaghị nabata Onyeisiala Buhari

Njem Onyeisiala Muhamadu bịara n'Imo Steetị mere ka ọtụtụ ndị ndu n'ala Igbo wuchie n'Owere ịbịa nabata ya.

Ndị gụnyere Dave Umahi nke Ebonyi steetị, osote gọvanọ Abia bụ Ude Oko Chukwu, Obi Onitsha bụ Igwe Achebe, George Obiozor bụ onyeisi Ohanaeze Ndigbo na ndị ọzọ.

Mana ọtụtụ ndị ọzọ bụkwa ndị pati All Progressive Congress a tụrụ anya ga-abịa ya bụ ọgbakọ abịaghị.

Ndị a gụnyere Rochas Okorocha, Orji Uzor Kalu, Ogbonnaya Onu, Ifeanyi Araraume, Chris Ngige na ndị ọzọ.

A mabeghi ihe mere ndị a abịaghị nabata Onyeisiala Buhari mana o doro anya na ndị dịka Okorocha, Araraume na-enwe nghọtaghị n'etiti ha na gọvanọ Uzodimma.

Rochas Okorocha esoghi nabata Onyeisiala Buharin'Imo

Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na Rochas Okorocha esoghi na nzụkọ nke na-aga n'ihu n'etiti Onyeisiala Buhari na ndị APC.

Cheta na Okorocha zigaara onyeisiala Buhari ozi ịnabata ya n'ụbọchị Tọzde ma gwa ya nwee ije ọma na njem ya.

N'otu aka ahụ o kwukwara na ọtụtụ ndị na-ama ya aka mgbe ọ banyere n'otu APC sozi na ndị na-erite uru dị na ya ugbua.

Buhari gbapere okporoụzọ n'Imo tupu ọ gawa obi gọọmentị izute ndị otu APC ma mee nzụkọ.

Ihe onyonyo pụtara na-egosi na onyeisiala Muhammadu Buhari atụọla ụkwụ n'Owere ugbua.

Gọvanọ Hope Uzodimma so na ndị mmadụ pụtara n'ọdọụgbọelu ịnabata ya n'ụbọchị Tọzde.

Foto si Owere apụta na-egosi etu gọvanọ Ebonyi bụ Dave Umahi nakwa Hope Uzodimma na-achị Imo si chebiri onyeisiala Buhari n'Owere taa.

Foto ndị ahụ gosikwara ebe ndị okenye Igbo ọzọ yi uwe isi agụ si nọkọ n'igwe na-echekwa onyeisiala.

Ọ bụ onye eyemaka Onyeisiala Buhari n'ihe mgbasaozi bụ Tolu Ogunlesi wepụtara foto ndị ahụ n'akara Facebook ya.

Etu ndị agha si akwado maka njem nleta Onyeisiala Naịjirịa

Ndị agha Naịjirịa na-eme mmeme inabata Onyeisiala Buhari n'ọdọụgbọelu nọ na Owerri, Imo Steetị ugbua.

Nke a na-abịa dịka ndị Ipob na-ekwu na ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ iji gosi iwe ha na onyeisiala Buhari na-abịa ọwụwa anyanwụ.

Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ndị mmadụ apụtaghị gaa ihe ha chọrọ n'Imo steeti.

Dịka onye ntaakụkọ si nụrụ ụfọdụ pụtara mana ha ahụghị ụgbọala, ụfọdụ apụtaghị chaa chaa ebe ndị ọzọ ji ụjọ nọrọ n'ụlọ maka mwakpo.

Taa bụ ụbọchị onyeisiala Muhammadu Buhari ga-eme njem nleta n'Imo state dịka Gọvanọ Hope Uzodimma si kwuo.

Chetna na Uzodimma bu ụzọ kwuputa nke a n'izuụka ikpeazụ nke ọnwa Ọgọst.

Mgbe nke a pụtara ihe otu Ipob kwuputara na ha manyere 'Sit-at-home' iji gosi iwe ha n'ebe onyeisiala nọ.

Mana gọọmentị steeti ahụ na-ekwusi ike na o nweghi ụdịrị ihe ahụ pụrụ ime na steeti ahụ ma gwa ndị mmadụ ha pụtaa mee ihe dịrị ha n'ụbọchị ahụ

Cheta na ha malitere ịgbachi ọtụtụ ụlọakụ n'isiobodo ha bụ Owere n'ihi emepeghị n'ụbọchị Monde n'ihi 'Sit-at-home' nke otu Ipob manyere kwa ụbọchị Monde n'ọwụwa anyanwụ.