A tọghapụla onyeisi ndị Juu n'Ogidi anwụchiri ya na ndị ọbịa Izrel

Lizben Agha na ụmụaka ndị Juu Igbo

Ebe foto si, Brigitte Limor

Nkọwa foto, Lizben Agha bụ onyeisi ndị Juu n'obodo Ogidi

Otu onyeisi ndị Juu n'Ogidi bụ Lizben Agha nke a nwụchiri ya na ndị ọbịa Izrel kemgbe otu ọnwa enwerela onwe ya.

Ndị isi nchekwa cheere na ndị ọbịa ahụ na ndị otu Ipob nwere ihe jikọrọ ha nke mere e ji nwụchie ha.

A tọghapụrụ Agha dịka otu dị icheiche na-arịrọ ya arịrịọ ọkachasị otu mba Afrịka akpọghị aha.

Agha nọ na-enyere ndị ọbịa atọ ahụ enyemaka mgbe ha bịara n'obodo ya bụ Ogidi ịme nchọpụta maka ndị Igbo bụ Juu.

Dịka nwa ya nwoke bụ Emmanuel si kwuo, anwụchiri nne ya na nna ya aha ya bụ Penielwere na be ha n'abalị ụbọchị 9 nke ọnwa Jụlai.

Emechara tọghapụ ha abụọ mana awụchigharịrị Agha dịka ọ rịọrọ ka o soro ndị ọbịa Izrel atọ ahụ ma nyere ha aka ebe a ji ha.

Ndị ọbịa ahụ kọwara na ndị nwụchiri ha cheere na ha na ndị otu Ipob nwere ihe jikọrọ ha.

Aha onyonyo, Sefer Torah ndị Izrel nyere anyị abụghị maka Biafra - Ndị Igbo Jew

Cheta na e ji onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu dịka a na-eche ka akpụpụ ya ụlọikpe.

Ihe mere ebe e jichiri ya

Nwa Igbo ndị Juu ebe ọ na-amụ akwụkwọ n'ụlọakwkwọ

Ebe foto si, Dani Limor

Nkọwa foto, Nwa Igbo ndị Juu ebe ọ na-amụ akwụkwọ n'ụlọakwkwọ

"Anyị lere anya n'ewkentị anyị ma hụ ebe ndị mmadụ na-ekwu na anyị bụ ndị uweojii pụrụiche mba Izrel (Mossad) bịara ịnyeaka nweta Biafra"

Mana o nweghi ihe dị etu ahụ anyị bịara ime kama ọ bụ ime nchọpụta na ndeko ka anyị bịara ime" ka Rudy Rochman bụ onye n'ime ndị anwụchiri kọwara.

E jichiri ụmụ nwoke ahụ abalị iri na asatọ ma jichie Lizben Agha abalị iri abụọ na itoolu.

Emmanuel Agha bụ nwa ya kọwara na ha amaghị ihe mere e ji nwụchie nne ha ogologo oge ahụ.

"Ahụ adịghị nne m, ọ maghị ihe mere eji nwụchie ya" ka o kwuru "a jụrụ m ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ mana ha azaghị m".

Rochman kwukwara na ha edebeghi ha na Agha n'otu ebe mana ha hụrụ ya otu oge mgbe ọ na-aga ịhụ onye Dọkịnta.

Ihe ruru mmadụ puku iri na ise bụ ndị Juuu na Naịjirịa ndị na-enwete enyamaka n'otu ndị Juu ọzọ dị n'ụwa niile mana mba Izrel ekwetabeghi na ha so bụrụ ndị Juu.