Gọọmentị Naijịrịa agwala onye nnọchite anya ya na mba Indonesia ya lọghachị mba Naijịrịa

Godfrey Onyeama

Ebe foto si, NIGERIA MINISTRY OF FOREIGN AFFAIRS

Naịjirịa akpọghachitala onye nnọchite anya ha na Indonesia bụ onye ndị ọrụ nchekwa na ahụ maka ndị njem nyụrụ ịkpakwụ ụnyaahụ.

Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ nchekwa mba Indonesia mekpara ya bụ nwoke nnọchịte anya ahụ na mba ha.

N'ime ihe onyonyo na-efeghari na soshal midia e gorosiri ka ndị ọrụ nchekwa na ahụ maka ndị na-eme njem (Immigration services) biri ya bụ nwoke aka ọjọọ aka ozuru ohi.

Gọọmentị etiti akatọọla ihe a mere, ma kwuo ka ndị ọrụ na ahụ maka mmekọrịta mba na mba tinye anya na ya bụ okwu ma hụ na a tara mba Indonesia ahụhụ maka agwa a.

Akụkọ na-ekwu ugbua na ya bụ nwoke emeruru ahụ na-arụ n'ụlọọrụ Nigerian High Commission.

E kwuru na ka ihe si mee bụ na ndị ọrụ nchekwa bịagịdere nwoke a n'ike, ebe ọ gara ịzụ ihe n'ahia nke dị na isi obodo mba ahụ bụ Jakarta.

Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta ala Naijịrịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffery Onyeama kwuru n'ozi ya na agwa a megidere iwu nwekọrịta mba ahụ na mba ndị ọzọ.

N'ụbọchị Mọnde ka a gwara ya bụ nwoke kwara ngwo ngwo ya lọghachịte Naijịria.

Gọọmentị mba ahụ ezipụtala ozi arịrịọ maka ihe a mere. Onyeama kwuru na ozi ya taa bụ Tuzde sị, "anyị amalitela ọrụ nyocha pụrụiche n'akụkọ ihe a mere, anyị ga-ekwupụta mkpebi anyị n'okwu na nso nso a". O kwuru si, "mkpesa anyị bụ ka gọọmentị mba Indonesia taa ndị mere ihe ọjọọ a ezigbo ahụhụ diri ha, maka agwa a ha kpara ezighi ezi"

"O nweghi ihe kwesiri ikpalite ime onye obia etu a ndị a si mee, ọkachasi onye nnọchite Naijịrịa." O kwuru na ihe bụ agwa ọjọọ a na-ekwesighi inabata cha cha.

Akụkọ ga-amasị gị