Nnamdi Kanu Re-arrested: Akwụkwọ njem Kanu ka dị na mba Kenya - Aloy Ejimakor

Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu onyeisi otu Ipob anwụchiri bụ Nnamdi Kanu ekwuola na n'ezie akwụkwọ njem ya bụ 'Passport' na Bekee dị na mba Kenya.

Ọ gwara BBC n'ekwentị na akụkọ nyocha nke ụlọ ntaakụkọ Guardian dị na mba Briten mere were chọpụta ihe a bụ nke ezi ya.

Ọ sị na "ọ pụtala ihe na Nnamdi Kanu bụ onye Naịjirịa ma nwee 'Passport' nke mba UK.

"E mekwere m ka amata nke a mgbe m degaaara onyeisi ụlọ nnọchiteanya nke mba UK dị na Naịjirịa ozi edemede maka nwụchi Kanu" ka o kwuru.

Ka ihe si kwụrụ ugbua

Ejimakor kọwara na mba Kenya dara iwu jikọrọ mmekọ mba na mba n'ịkpọrọ Nnamdi Kanu akpọnye gọọmentị Naịjirịa.

Iwu a bụ iwu pụrụiche akpọrọ 'Rendition' bụ mgbe otu mba nwụchiri onye is mba ọzọ n'ụzọ ezighi ezi.

O kwuru na iwu ahụ malitere na 'Geneva Convention' nyere ka akpọghachi onye ọbụla nwere mba abụọ dịka Kanu na mba ebe o bi.

Cheta na gọọmentị mba Kenya ka na-agọpụ na aka ha adịghị na nwụchi na mkpọlata Nnamdi Kanu e mere n'ọnwa Juun.

Ebe gọọmentị mba Briten nke gụnyere Lord Alton bụ onye omeiwu na-ajụ ajụjụ gbasara ebe ya bụ ihe si mee.

Mkpebi otu Ipob mere gbasara mba Kenya

Ọnụ na-ekwuru otu Indigenous People of Biafra bụ Emma Powerful kwuru na obi adịghị ha mma etu gọọmenti ndị Kenya na-agọ na aka ha adịghị na nwụchị

O kwuru na ha na-agwa ndị otu Ipob nakwa "ụmụnne anyị" niile nọ ebe ọbụla ha nọ ha abazila ụgbọelụ ndị Kenya ọbụla"

N'ọnụ ya, "onye ọbụla bụ onye Biafra maọbụ onye Igbo nọ ebe ọbụla, ịhụ ihe ọbụla gbasara ndị Kenya, wepụ aka, egola ya, akwadola ya."

Powerful kwuru na ọ bụ onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu gwara ndị otu Ipob na ọ bụ gọọmenti Kenya na gọọmenti Naịjirịa jịkọtara nwụchie Kanu.

N'ọnụ ya , ọ bụrụ na ndị bi na Kenya kwuo na ha amaghị maka etu e si nwụchị Kanu, ha mee ngaghagharị iwe gakwuru gọọmenti ha, nke ga-eme ka eziokwu pụta ihe."

"Uhuru Kenyatta bụ onyeisiala Kenya egosila na ọ bụ oyi egwu maka etu o si kwe ka anwụchie Nnamdi Kanu na mba ya."

Nnamdi Kanu bụ onye ndu anyị ka bụ onyeisi anyị agbanyeghị na-anwụchịrị ya."

Powerful kwuru na Kanu wepụtara atụmaatụ etu Ipob ga-esi gaa tupu anwụchie ya.

"Onye ọbụla na-ekwu na Ipob enwela maọbụ ga-enwe onyeisi ọhụrụ makana Kanu nọ n'ime , na-atụ ezigbo asị."

Cheta na mba Kenya gọrọ ukwụ na aka na ha adịghị n'ihe mere Nnamdi Kanu, ma sịkwa ka ndị sị n'aka ha dị ya wete akaebe.

Ihe Ipob chọrọ ugbua

Powerful kwuru na otu Ipob chọrọ ka atọghapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.

O kwukwara na ndị ọkaiwu Igbo nọ na London akpụkpụla gọọmenti etiti n'ụlọikpe International Criminal Court gbasara nwụchigharị Nnamdi Kanu.

Cheta na onye ọkaiwu n'ekwuchitere Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor gwara BBC Igbo ụbọchị Satọde na ha na-ahazi etu dọkịta Nnamdi Kanu ga-ezute ya kwam kwam.

Ọ kwuru na nke a bụ maka mmerụ ahụ nakwa obi ya ọ sị zara aza site n'ihe ọ gabigara n'oge a nwuchiri ya.

Ọ si na ọ bụ site na nnyocha ndi dọkịta na Kenya mere ka e siri chọta na obi Kanu zara aza. Ọ sị n'ezia n'aka ndị uweoji mba Kenya dị na nnwuchi Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: