Nnamdi Kanu Latest: Mba Briten amalitela ịjụ Naịjiriaa ese etu ha si nwuchie nwa afọ mba ha

Mba Briten ekwuola na ha na-ajụ gọọmentị Naịjirịa ajụjụ banyere etu ha siri nwụchie Nnamdi Kanu bu onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob).

Kanu dị afọ 53 bụ nwaafọ Naịjirịa ma jirikwa akwụkwọ nyere ya ikike dịka nwaafọ Briten.

Kanu na-aza aziza banyere ebubo na ọ na-akpa nkata imegide Naịjirịa nke Bekee kpọrọ "Treasonable Felony".

Ngalaba British High Commission na Naịjirịa gwara BBC na ha na-achọ ịmata ma nnwuchi Kanu "omegidere iwu".

Ha sịkwa na ha ga-enye ya nkwado a kpọrọ "consular assistance".

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Dean Hurlock kwukwara na ọ bụghị na Briten ka ejidere Kanu ma sịkwa na ọ bụghị ebe e si kpọlata ya.

Ọ sị na mba Briten na-ele anya na ikpe a na-ekpe ya ga-eso usoro ziri ezi.

Ọ bụ ngalaba uweojii nzuzo bụ 'Department of State Service' (DSS) ji Maazi Kanu ugbua dịka ulọikpe si ka ejide ya ruo oge ọ ga-alaghachite ụlọikpe.

Ọ bụ ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị 2021 ka Mazị Nnamdi Kanu ga-alaghachi ụlọikpe.