You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abubakar Shekau: Anyị na-enyocha akụkọ ọnwụ onyeisi ndị Boko Haram - Ndịagha Naịjirịa
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha ka na-enyocha akụkọ na-efesa n'ebe niile ugbua nke na-ekwu na Abubakar Shekau, onyeisi ndị Boko Haram, anwụọla.
Mohamed Yerima, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha gwara BBC na-ha agaghị ekwu kpọmkwem ihe merenụ ruo mgbe ha mechara nnyocha a ma nwee ọkpụrụkpụ ihe ha ji aka.
Akụkọ pụtara n'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ nke ọnwa Mee afọ 2021 bụ na Abubakar Shekau, bụ onyeisi ndị Boko Haram, anwụọla.
Aha Shekau na-ewu na Twitter nakwa Google dịka ndị mmadụ na-achọ ịmata nke bụ eziokwu.
Otu onye ntaakụkọ kwuru na Shekau anwụọla n'eziokwu dịka o ji ogbunigwe gbarie onwe ya oge ndị ọgụ 'Islamic State in West African Province' (ISWAP) wakporo ya.
Mana ndị ntaakụkọ AFP kwuru na Shekau chọrọ igbu onwe ya mana ndị ọgụ ahụ gbochiri ya, nke pụtara na ọ ka dị ndụ.
Onwebeghị onye ma nke bụ nke.
Akụkọ ọhụrụ a gbasara ọnwụ Shekau gbara ọtụtụ mmadụ gharịị n'ihi na ugboro ugboro ka ndị agha pụtarala kwuo na ha egbuola Shekau, mana o mechara bụrụ na Shekau ka dị ndụ.
Julaị 2009
Ọ bụ n'oge a ka Abubakar Shekau weere ọchịchị dịka onyeisi Boko Haram, ndị uweojii gbuchara onyeisi ha mbụ bụ Mohammed Yusuf.
N'oge ahụ, akụkọ kwuru na e gburu Shekau oge ndị ọrụ nchekwa na ndị Boko Haram kwakọtara mgbọ.
Julaị 2010
Shekau pụtara n'ihe onyoonyoo ma kwuo na ọ bụ eziokwu na a gbatara ya egbe n'ụkwụ mana ọ ka dị ndụ.
Ọ bụ n'ihe onyoonyoo a ka ọ nọ kwuo na ya abụrụla onyeisi Boko Haram.
1. Ọgọstụ 2013
Akụkọ nnyocha ndị agha kwuru na a gbatara Shekau egbe oge ndị Boko Haram na ndị agha lụrụ ọgụ n'ọhịa Sambisa, n'ụbọchị 30 nke ọnwa June 2013,
Akụkọ ahụ kwuru na Shekau nwụrụ n'etiti ụbọchị 25 nke ọnwa Julaị ruo ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọst 2013.
Sepụtemba 2013
Ndị Boko Haram wepụtara onyonyoo ebe otu nwoke kwuru sị na ọ bụ Shekau na-ekwu okwu.
Mana ndịagha Naịjirịa kwuru na nwoke ahụ abụghị Shekau chaachaa.
2. Sepụtemba 2014
Ndịagha Naịjirịa kwuru na ndị agha Kamerun egbuola Shekau.
Ha kwuru na ọ bụ oge Boko Haram chọrọ iweghara obodo Konduga nke dị nso na Maiduguri ka Shekau nọrọ zute ọnwụ ya.
Ndịagha Kamerun kwuru na nke a bụ eziokwu, ma wepụtakwa foto nke ha sị na ọ bụ ozu Shekau.
Mana ndị ntaakụkọ kọwara na onye nọ na foto ahụ abụghị Shekau.
Ọktoba 2014
Shekau mekwara ihe onyonyoo ọzọ ebe ọ nọ na-achị ndị agha ọchị ma na-akwa ha emu.
3. Ọgọstụ 2015
Onyeisiala mba Chad bụ Idriss Deby kwuru na ha akụpịala Boko Haram, ma kwukwara onye ọzọ anọchiela anya Shekau.
Ọgọstụ 2015
Mana n'otu ọnwa Ọgọst ahụ, Shekau wepụtara ozi na soshal midia ma kwuo na ya ka dị ndụ ma bụrụkwa onyeisi Boko Haram.
4. Ọgọst 2016
Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa wepụtara ozi na na ha ji ụgbọelu tụọ ogbunigwe n'obi ndị Boko Haram.
Ha kwuru na Shekau merụrụ nnukwu ahụ ma nọrọ n'ọnụ ọnwụ.
Sepụtemba 2016
Shekau wepụtara ihe onyonyoo nke gosiri na ọ dị ndụ, na o nweghịkwanụ ahụ o merụrụ.
Dịka a ka na-eche ka ndịagha Naịjirịa kwuo okwu gbasara akụkọ ọhụrụ a, ọtụtụ na-ekwu ka ọnwụ Shekau ghara ịdịkwa ka ndị mbụ.