Boko Haram: 'Anyị anwuchiela ndị isi Boko Haram 10' - Ndịagha Naịjirịa.

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndịagha Naijirịa anwụchiela mmadụ iri ha sị bụ ndị isi otu Boko Haram soro wakpo obodo ndị di na okpụrụ ọchịchị Gwoza nke Borno steeti n'afọ 2014.

Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Aminu llIyasu kwuru nke a n'akara Twitter ha na satụde, na ha nwuchịri ndịa n'ụbọchị Tụzde dịka ha na-agba ọsọndụ maka mwakpo ndị agha na awakpo ha na mpaghara Gwoza.

Aha ndị a aka kpara bụ ShettimaMustapha Umar, Abba Buji, Alhaji Bukar Madu-(KAHID - Onye Boko Haram ọkwa ya dịka nke 'Brigadier General' ndịagha), Ali Hassan (Ukọchụkwụ ha), Alkali Laminu, Bukur Mustapha, Buba Umaru (Eji 'Black Uhuru' mara) ,Madu Nosobe, Mustapha Hussaine na Umar Jeddum.

Ha niile si n'ọpkuruọchichị Bama dị na Borno steeti.

Nwunye Onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari

Nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari awuchiela na Naijiria n'ụtụtụ a dịka ọ gara ezumike na mba Ingland.

O soro dị ya gaa mba Saudio Arabia maka haji, ebe ha sitere gawa London, Ingland.

Ebe ahụ ka ọ nọrọ nwee ezumuike.

Ụfọdụ ndi nwunye gọvanọ biakwara sị ya nnọọ na ọdọ ụgbọelu nke Nnamdị Azikiwe dị na Abuja.

O kwukwara n'akwụkwọ ọ depụtara na ya enwela ike i ji bido ọrụ maka nkwalite ahuike ụmụaka, ndị nne na kwa ndị ọzo na arịa ahụ na Naijirịa.

N'Anambra steeti

Mịnịstịrị na-ahụ maka Teknụzu na Naijirịa etoola Anambra steeti dịka ọkachasị n'ihe gbasara Sayencị na Teknụzụ.

Ọ bụ mịnịsta na-ahu maka Teknụzụ bụ Ogbonnaya Onu kwụrụ nke a na emume 'World Space Week' ma rịọ ka ụmụakwụkwọ tinye ụchụ na agụm akwụkwọ .

N'Ofesi

Akwa arịrị na-ada na Burkina Faso dịka ndị ana amaghi ndị ha bụ banyere n'ụlo ndị ofufe Alakụba were gbuo mmadụ iri na ise ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ.

Onweghị ndị pụtara kwuo na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a kama a na eche na ọ bụ ndịagha ọgụ Jihad kpara ya bụ mkpamkpa.

N'Egwuregwu

Ndị otu super Eagles nọ na Naijirịa na-achọ ọkpu goolu atọ ha ga eji gbapụ ndị nke Togo maka Ntozu asọmpị 'African Nations Championship' nke 2020.

Ha ga-enwe ohere a na ụbọchị 19 nke onwa oktober na Legos iji bụkwara mmeri ndị Togo meriri ha na be ha.

Cheta na ndị otu Togo ji ọkpụ goolu anọ a asatra otu were merie ndị Super Eagles na be ha Ka ọ dị ugbua SuperEagles na achọ goolu atọ ha ga-eji gbapụ ndị Togo na asọmpi a.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị