Aisha Buhari: Kedụ ebe agụ nwaanyị a nọ ugbua?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia ajụ ese ebe nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari nọ kamgbe ọnwa ise.

Ụfọdụ kwuru na ha na-achọ ha maka etu o si ekwu okwu na-atụghị ụjọ ma ihe na-eme na Naịjirịa.

Ọbụghị ọsọ ka Aisha Buhari gbara n'Aso rock dịka akụkọ na-ewu si ekwu- gọọmenti etiti

Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na ọ bụghị mbọ mbọ ọsọ ka nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari riri n'Aso Rock kamgbe ọnwa abụọ.

Ọnụ na-ekwuru Aisha Buhari bụ Suleiman Haruna gọrọ na ọ bụghị mgbapụ maka ihe ndị mmadụ kpọrọ 'atụmaatụ ọjọ' dị n'ọchịchị di ya bụ Buhari ka o mere.

Akụkọ na-ewu ewu na-ekwu na o teela ahụrụ Aisha na di ya mgbe ha gakọrọ emume nakwa na o si Saudi Arabia gawa London dịka e mechara emume okwukwe Hajj.

Haruna kwuru na nwunye onyesisiala nwere ikike ị ga njem n'ebe ọbụla sọrọ ya dịka nwafọ Naịjịrịa a na-ekeghị agbụ.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ ụlọọrụ mgbasa ozi Punch na ọ bụ eziokwu na Aisha Buhari anọghị na Naịjirịa ugbua mana ọ bụghị maka esemokwu ọbụla.

Mgbe ndị ụlọọrụ ahụ jụrụ Haruna maka kepu kepu a na-anụ maka etu agwa ndị gbara dị ya okiri okiri si ewute ya mere o ji gbafuo.

Haruna kwuru na ya bụ akụkọ na-agbagwọjụ ya anya makana ọ maghị ebe o si.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

@OlayinkaLere na-ajụ ebe nwunye onyeisiala nọ?

@NekkaSmith kwuru na ọ bụ makana nwunye onyeisiala anaghị arụsị ọrụ ya ike kpatara eji gba ya nkịtị,

@Tutsy22 na-ajụsi ike ebe Aisha nọ?

Ụfọdụihe ndị Aisha katọgoro maka ọchịchị di ya bụ Buhari

  • O kwuru na ndị na-agwa dị ya ihe ọ na-eme n'ọchịchị bụ ndị na-enyereghi aka maka mmeri ya dịka onyeisiala.
  • O kwuru ka di ya nye ụmụnwaanyị oche ọchịchị na ngalaba dị iche iche na Naịjirịa nakwa pati All Progressive Congress(APC).
  • Ọ katọrọ etu esi eme ụfọdụ atụmaatụ dị ya wepụtara dịka (N500bn Social Investment Programme) nke o kwuru kụrụ afọ n'ala n'ugwu Hausa mana Maryam Uwais bụ onye nchịkọta ya bụ atụmaatụ kwuru na nwunye onyeisiala aghọtachaghị ya bụ atụmaatụ ọfụma.

Ihe nkiri a ga-amasị gị

Akụkọ ndị ga-amasị gị