You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Aisha Buhari: Ugboro ano nwunye onyeisiala tiri mkpu n'ọha
Ndị mmadụ amarala nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari ka onye adịghị atụ okwu ụjọ.
Ya metụ ọrịakụ Buhari n'obi, o kwupụta ya.
Nke na-ewu ugbua bụ okwu o kwuru n' ụbọchị anọ nke ọnwa Decemba 2018 na nzukọ a kpọrọ 'National Women Leadership Summit e mere n'Abuja.
Nwunye onyeisiala sị na agbanyeghị na ọ bụ nde kwuru nde mmadu tụnyere Buhari na ntuliaka nke 2015, ọ bụ naanị mmadụ abụọ maọbụ ji ọgbataụhịe gọọmentị ya.
Okwu ya a nwuru ọkụ na soshal midia.
Ụtụtụ mmadụ na-ajụzị ndị bụ ndị a Aisha Buhari kpọrọ aha.
N'ọnwa Ọktoba nke 2017, nwunye onyeisiala bara onyeisi ụlọọgwụ di n'obi onyeisiala bụ Husian Munir mba maka etu ụlọọgwụ ahu dị.
Dịka nke a mere ọhụrụ, ọ bu kwa n'ọha ka Oriakụ Buhari kwuru okwu a.
Okwu ọzọ Aisha Buhari kwuru dara ụda ọfụma bụ mgbe ya na BBC mere mkparịtaụka n'afọ 2016.
Na ya bụ mkparịtaụka, Aisha kwuru na site otu ihe dị, na ya agaghi ikwado di ya.
Okwu tara akpụ, nke mere Buhari na onwe ya jiri tinye ya ọnụ mge ya na onyeisiala Jamani bụ Angela Merkel nwere nzukọ n'afọ ahụ.
Mgbe ahu ka Buhari si na nwunye bu onye isi ekwu.
4) Ka APC mechara ntuliaka imeulo ha, Aisha Buhari gara n'akara ya na Twitter ba ezigbote mba maka etu ha bu ntuliaka siri ga.
Ndị mmadụ sị na o bu makana nwanne ya nwoke enweteghị ọkọrọto iji zụọ ọchịchị gọvanọ Adamawa n'okpuru APC.
Nke bụ eziokwu bu na enwebeghi nwunye onyeisiala Naịjirịa na-aputa ekwu okwu banyere ọchịchị di ya n'ọzọ a. Aisha pụrụiche.