You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Robert Mugabe: E liela odogwu Afrịka a n'obodo ya
Akụkọ dị mkpa:
E liela ozu Robert Mugabe, aka chịburu mba Zimbabwe, bụ onye lara mmụọ n'izuụka atọ gara aga ka ọ gbachara afọ iri itoolu na ise.
E liri Mugabe n'ime Obodo ebe a mụrụ ya bụ Kutama, nke dị kilomita iri itoolu na ise (95km) ma a gawa Harare bụ isi obodo Zimbabwe.
Cheta na gọọmentị Zimbabwe na ezinụlọ Mugabe nwere obere nghọtahie maka ebe a ga-eli ya.
Gọọmentị chọburu ka e lie Mugabe ebe a na-eli ndị dike obodo ji biri, mana ezinụlọ ya ekweghị.
Ha kwuru na Mugabe chọrọ ka ili ya na nke nne ya bụ Bona dịkọta nso.
Onweghị onye ọrụ gọọmentị gbalitere n'ọkwa bịara olili Mugabe.
Nwunye ya bụ Grace nakwa ụmụ ya socha duru akpati ya ruo mgbe a dọnyere ya n'ala.
Naịjiria eturula ugo na Montreal
Naijiria emeriela na ntuliaka e mere iji họpụta ndị ga abụ ndị isi otu 'International Civil Aviation Organization' nke bụ otu na-ahụ maka njem ụgbọelu n'ụwa niile.
Mmeri a Naijiria nwetara na ntuliaka a e mere na Montreal, Canada, ga-eme ka Naịjirịa nọgide na ndị isi otu a ruo afọ atọ na-abịa abịa.
Okwu 'Xenophobia'
Aka chịburu Naịjiria bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na o nwere olileanaya na nzute nke onyeisiala Muhammadu Buharị ga-ezute onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ga-eme ka okwu gbasara Xenophobia nyụo ka ọkụ.
Obasanjo kwuru nkea na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere n'ogige ọba akwụkwọ ya nke dị na Abeokuta n'ụbọchị Satọdee.
Chi ndị Liverpool mụ anya
N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Liverpool ji agba ekpere chi merie ndị Sheffield United n'asọmpi 'English Premier League' nke taa.
Liverpool ji otu ọkpụ goolu asataghị asata wee nweta mmeri.
'Shot' Georginio Wijnaldum gbara si n'okpuru ụkwụ ochee goolu ndị Sheffield wee piofere wee lakpuo na neetị.
N'asọmpi ndị ọzọ, Chelsea ji goolu abụọ asataghị asata wee merie ndị Brighton.
Tottenham gbalịrị were goolu abụọ a satara otu merie Southampton, ebe Wolves gbara Watford 2-0.
Manchester City na Everton ka na-achịpụ ya ugbua.
Onye akparịkwala onyeisiala o
'A sị na onye keele Eze, Eze eruo ya aka' bụ nkọwa onye enyemaka mgbasa ozi Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steeti bụ Francis Nwaze.
O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ banyere ịdọ aka na ntị gọvanọ Umahi dọrọ ndị ọrụ ya maka ịkparị onyeisiala Buhari na ndi ọchịchị ndị ọzọ.
Ọ sị kwara na ọ dịghị mma ị na-akparị onye nọ n'ọchịchị n'ihi na ọ dịghị mfe mmadụ ị nọ n'ọchịchị.
Nwaze sị na ọ ka mma iji nwaayọ gwa onye na-achị achị njọọ ya karịa ịkparị ya n'ụzọ n'ezighi ezi.
"E nwere ezi ndịiche dị n'ikparị mmadụ na iji nwaayọ gwa onye ahụ na ihe ọ na-eme adịghị mma.
Gọvanọ Umahi sị na ọ bụghị ịkpọ onye ọchịchị iyi ga-enye gị ihe ị na-achọ."
Cheta na gọvanọ Dave Umahi yiri egwu na ọ ga-achụ ndị ọrụ ọbụla kparịrị onyeisiala Buhari na ndị ọzọ na-achị achị.
Ntuliaka Steeti Bayelsa na Kogi:
Ụlọọrụ Inec ewepụtala aha pati iri abụọ na atọ na Kogi Steeti nakwa pati iri anọ na ise na Bayelsa Steeti maka ntuliaka ọkwa gọvanọ.
Site n'akwụkwọ ụlọọrụ a wepụtara bụ nke Festus Okoye ọnụ na-ekwuru ha tịnyere aka na ya, ha sị na ntuliaka a ga-adị n'abalị iri na isii nke ọnwa Nọvemba 2019.
N'Amerịka:
Ndị Pati Democrat nke mba Amerịka enyela odeakwụkwọ mba ahụ bụ Mike Pompeo iwu ka o wepụta akwụkwọ na-egosi mmekọrịta ọchịchị Trump na mba Ukren.
Ndị isi kọmitii atọ n'ụlọomeiwu nyere Pompeo otu izuụka iji wepụta akwụkwọ ndị ahụ.
N'egwuregwu
Ọ bụkwa okwu Tacha ka akpụ n'ọnụ na Naịjirịa dịka Big Brother Naija nyere ya ọsọ ụkwụ eru ala n'emume ha.
A chụrụ Tacha dịka ya na Mercy kọchara ọnụ n'ụlọ Big Brother Naija n'ụbọchị Fraịde.
Tacha bụ onye e ji 'no leave no transfer mara' mechara laa n'ụzọ ihere.
Nkeji:
Ihe nkiri: