Burna Boy, Wizkid eturula ugo 'Grammy'

Ebe foto si, Getty Images
Otiegwu Naijiria bụ Damini Ebunoluwa Ogulu a ma díka 'Burna Boy eturula ugo 'Grammy' maka "Best Global Music Album".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke a bu mbụ otiegwu onye Naijiria na-erite nturuugo ahụ na-ada ụda n'ụwa nke ngalaba "National Academy of Recording Arts & Sciences" nke mba Amerịka hiwere n'afọ 1959 maka ịkwanyere ndị otiegwu ọkaibe ugwu.
Cheta na n'afọ gara aga, aha Burna Boy so na ndị ahọpụtaburu maka nzere 'Grammy' maka egwu ya ọ ọkpọrọ"Twice As Tall" n'afọ 2020 mana o riteghị nturugo ahụ.
N'otu aka ahụ, Wizkid ritere tulugo maka "Best Music Video" n'egwu ya na Beyoncé tiri bụ "Brown Skin Girl", nke si n'efere egwu "Lion King: The Gift".

Ebe foto si, @wizkidayo
Cheta na nkea na eme ya nke ugbo abụọ ana ahọpụta burna boy maka ya bụ ntuwe ugo.
Ahọpụtara ya n'afọ 2019 ebe Angelique Kidjo nọrọ maburu ya bụ mmeri.
Na ntuwe ugo grammy nke afo a, Wizkid nwetara mmeri site na ihe onyonyo egwu ya na Beyonce kụkọrọ ọnụ akpọrọ "brown skin girl".
Burna Boy na nke ya nwetara ntuwe ugo dika egwu kacha wuo ewu na mba ụwa bụ "best global music album".
Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ụmụafọ ala anyị ajaala ha mma ebe ọ di ukwuu, ndi dika Nkem Owoh nakwa ọtụtụ ndi ọzọ maka ntuwe ugo a ha ritere bụkwa agba nke iri isi na atọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
A mụrụ Burna Boy na Port Harcourt isi obodo Rivers steeti ma bụrụkwa ebe ọmalitere iti egwu.
Akụkọ ka na-abịa











