Brexit: Ihe ga-eme dịka mba UK na-ahapụ Ọgbakọ Yurop Kpam Kpam na Jenụwarị 1, 2021

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Praịm Minista mba Briten bụ Boris Johnson ekwuola na njem mba ahụ nọ maka ịpụta ọgbakọ mba Yurop abịala na mmezu dịka ha na ndị na-anọchite anya Yurop bịara na nkwekọrịta maka atụmatụ Brexit.

Nke a pụtara na Brexit ga-esu n'ụbọchị mbu nke ọnwa jenụwarị afọ 2021.

Johson sị: "na-agbanyeghị na anyị apụọla na otu European Union, Anyị na Yurop ka nọkọtara".

Johnson kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntakụkọ okwu ụbọchị tọzde.

Okwu ya bịara dịka ịkasị ndị mmadụ obi dịka ọtụtụ na-atụ ụjọ ihe ọpụpụ a pụtara.

Gọọmenti mba Briten kwuru sị "anyị enwetakwala ikike n'elu ego anyị, iwu okeala, iwu obodo, azụmahịa nakwa mmiri a na-akpụ azụ".

Mba dị na Yorup dịka Jamini, Fransi ,Austria na ndị ọzọ akwadola ọpụpụ Briten pụrụ n'otu jikọrọ ha.

Ebe njem a malitere

O meela afọ anọ (site Juun afọ 2016) ụmụ afọ Briten tụrụ vootu were kwuo na ha chọrọ isi na otu "European Union" pụọ.

Mana o ruola afọ 50 kemgbe ha kwenyere isu n'ọgbakọ Yurop nke mere ka ewepu oke ala mba niile nwere nkwekọrịta ị bụ otu ahịa nke Bekee kpọrọ "EU Economic Zone".

N'oge ahụ, ọ bụ sọsọ Briten jidesiri ego aha aka dịka ndị ọzọ ji ego Euro gbanwe nke ha.

Ihe Brexit ga-ebutere ndị Briten

Brexit a pụtara na ndị Briten abụghịzị ndị Ọgbakọ Yurop nke pụtara na oke ala ha abụghịzi ihe mmadu maọbụ ibu ga-agafe etu o si chọọ.

Onye chọrọ isi Yurop gaa Briten maọbụ Briten gaa Yurop ga-ejizi akwụkwọ ikike. Tupu e binya aka n'akwụkwọ Brexit a, mmadu na ibu na ụgbọala na-abata ma na-apụ na-enweghi mbochi.

Ndị Yurop agaghị a na-ebinwụ na Briten.

Ndị Briten agaghị enwesi ikike ibi na Yurop n'enweghi akụkọ.

Etu o si metụta Nọten Ịland

Mba Nọten Ịland ka ga-anọ n'ihe a kpọrọ "EU single market for good".

Briten na Yurop nwere nkwekọrịta iji hụ na oke ala Nọt ana Sawụt Ịland agbachighị agbachi.

Nke a pụtara na ihe emepụtara na ịnland ka ga na-abanye Yurop na-enweghị mgbachi ọbụla.

Ihe ndị ọzọ Brexit metụtara

Ọ bụghị sọsọ azụmahịa nakwa nagharị mmadụ ka iwu a metụtara.

Dịka nkwekọrịta eji hibe Ọgbakọ Yurop siri di, o metụtara njem ala n'ụgbọelu, atụmatụ ngbanwe eligwe a kpọrọ "climate change" nakwa mmekọrịta nchekwa.

Ugbua, mmekọrịta siri welele ndị a niile ga-abịa na njedebe.

Ọ ga-arịa ahụ inwete mmekọrịta ga-awa n'ihu karịa etu ọ dibu na mbụ.