You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe 6 mere ka 2020 pụọ iche
Ọ fọrọ awa ole na ole tụpụ anyị abanye afọ 2020.
Dịka i na eme njikere maka afo ọhụru a, lee ihe isii ikwesiri ị ma maka afọ a.
Ọgbakwụnyere otu ụbochị
N'ọgụgu ụbọchị afọ dịka ndị bekee sị agụ ya, afọ 2020 gbakunyere otu ụbọchi.
Nke pụtara na o nwere mkpụrụ ụbọchị nari atọ na iri isii na isii.
Nke a bụ nke ndị bekee na-akpọ 'Leap Year'.
Ihe ga-eme n'igwe
Ọnwa na acha anụnụ anụnụ ga-apụta n'eluigwe n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Oktoba
Nke dịka ibe ya, a ga-enwe mkpuchi anyanwụ bụ nke Bekee kpọrọ 'Solar Eclipse' n'abalị iri abụo na otu nke ọnwa Jun.
Mana ọ bụ ndị mba Etiopịa, Ọman na Tibetị ga-ahụ nke a.
A ga-enwekwa mkpuchi ọnwa (Lunar Eclipse) ụgbọro anọ n'afọ 2020.
Mana ọ bụ naanị ugboro atọ ka a ga-ahụ ya n'Afrịka.
Nke mbụ bụ n'abalị iri nke ọnwa Jenụwarị (Wolf Moon Eclipse); nke abụọ bụ n'abalị ise nke ọnwa Jun, ebe nke atọ bụ n'abalị ise nke ọnwa Jụlaị (Thunder moon Eclipse)
Egwuregwu Olịmpịk
N'obodo Tokyo dị na mba Japan ka a ga-eme emume egwuregwu olimpik nke afọ 2020.
Ihe karịrị mba narị abụọ nakwa mmadụ puku iri na otu ga esonye n'egwuregwu a.
Egwuregwu a ga-ebido site n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọgọstụ ruo abalị isii nke Sepụtemba.
BREXIT
Ọnwa Jenụwarị afọ 2020 gbaa mkpụrụ ụbọchị 31 ka mba 'United Kingdom' kwuru ha ga ahapụ otu Yuropịan Yunịọnụ.
K bugharịrị ụbọchị ọpụpụ ha site n'ọnwa Machị gaa Ọktoba afọ 2019, tụpụ ha etinye ya n'ọnwa Jenụarị.
5G
Ị chetara na ọ bụ n'afo 2019 ka ụfọdụ ndi ụlọọrụ na-ere Ịntanetị bidoro ire 5G nke na eme ka igwe Intanetị dị ọsịsịọ?
Kama dịka ụlọ ntaakụkọ FORBES na-akọwa na ọ bụ na afọ 2020 ka Igwe 5G nke Intanetị ga-eju ma bara abara.
Ufọdụ Igwe ihe ndị Google ga-ewepụ n'afọ 2020
Ndị ụlọọrụ 'Google' na-akwado imemile ụfọdụ ngwa ọrụ na Igwe eji mara ha. ha gunyere
Ego mmanụ agbidi
Ngalaba ụloakwụkwo na-ahu maka akụnaụba uwa bụ 'Institute of International Finance' na-akowa na egọ eji egote mmanụ agbidi ga agbadata.
Ha kowara na ihe ga-ebute nkea bụ n'ihi etu ndị mba Amerịka, Kanada na Brazịl si egwuputa mmanu agbidi n'ike n'ike.
Ha na-atụanya na ọ ga abụ ihe dịka karama mmanụ agbidi nde na ọma itolu ka a ga na emepụta uwa niile kwa ụbọchị.
Akụkọ ga-amasị gị
Ihe nkiri ga-amasị gị: