Ghana Election 2020: Ndị pati mgbagha mba Gana ajụla mpụtara ntuliaka nyere Nana Akufo-Addo mmeri

Pati anọghị na gọọmentị mba Gana bụ ndị isi mgbagha ajụla mpụtara ndị ọrụ ntụlịaka ha nụ Ghana Electoral Commission wepụtara bụ nke nyere Nana Akufo-Addo mmeri.
Ya bụ Pati ndị mgbagha bụ National Democratic Congress sị na-enwere ọtụtụ nrụrụaka na ya bụ ntuliaka mana ha ga-agwa ụwa ebum n'obi ha mgbe adịghị anya.
Ndị ụlọọrụ ntuliaka mba ahụ bụ nyere Nana Akufo-Addo mmerị ka ha mechere ntuliaka onyeisiala mba ahụ.
Ndị ọrụ nnyocha ya bụ ntuliaka mba Gana nakwa ndị mba ofesi sị na enweghị ihe nruruaka ha hụrụ na ya bụ ntuliaka.
Akufo-Addo nke otu 'New Patriotic Party' (NPP) ji voootu dị pasent 51.59 nke bụ vootu dị ọnụọgụgụ 6,730,413 were merie.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe meburu
Ngụkọ vootu a tụrụ na na ntuliaka mba ahụ ka na-aga n'ihu dịka a gụkọchabeghị vootu nile a tụrụ na ntụliaka ahụ mana onyeisi EC bụ Jean Mensa kwuru na nke a gụrụla ezuola ịma onye meriri.
Mensa kọwara na mpụtara ọ kpọpụtara enweghi vootu mpaghara ndida Techiman n'ihi na ngụkọ ka na-aga ihu ebe ahụ.

E mechaala ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana dịka ndị ọrụ ntuliaka si kwuo
Ihe fọrọ ugbua bụ ka a gụkọọ mpụtara ntuliaka ndị a na mpaghara iri na isii ebe e mere mbinyeaka n'akwụkwọ ma kpọpụta onye meriri.
Ndị uweojii Gana nwuchiri ndị ọrụ ntuliaka abụọ aka ha dị na nrụrụaka n'Awutu Senya West na Bawka Central.
Onyeisi ndị uweojii Gana sị na a gbara mmadụ abụọ egbe na mpaghara Awutu Senya East.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Onyeisiala ha bụ Nana-Akufo-Addo arịọla ka udo chịa na mpaghara niile. Ọ bụ n'ime otu ụbọchị ka a ga-ama onye meriri.
Etu ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana si gaa

Akụkọ a chịkọtara ka ntuliaka nke ọkwa onyeisiala mba Ghana si aga ugbua.
Onyeisiala mba , Nana Akufo Addo atụọla vootu ya na woodu Rock Ages preparatory school 1and 2 Kibi.
Ọ sị na obi dị ya ụtọ etu ntuliaka ahụ si aga nke ọma na mba ahụ.
John Dramani Mahama atụọla vootu ya

John Mahama bụ onye ji ọkọlọtọ pati NDC nakwa aka chiburu Ghana atụọla vootu ya.
O kwuru na oge ka pere mpe ikwu ka ya bụ ntuliaka si aga mana o ji nkeji atọ tụọ vootu ka ọ tụchara vootu na Bole.
Foto dị n'elu gosiri etu onye ụlọọrụ ntuliaka Ghana si wetu igbe ntuliaka ka onye olusi tụọ vootu

Ọ bụghị eziokwu na-afojuru igbe ntuliaka n'ọdịda anyanwụ Ghana

Ndị uweojii nọ na Ghana ekwuola na amabeghị ma ebubo na-afọjuru igbe ntuliaka na ndịda anyanwu Ghana abụ eziokwu.
Ha kwuru ka ndị Ghana dere jụụ makana ha na-enyocha ma ebubo a abụ eziokwu ma gwa ha nchọpụta ha.
Ọnụọgụgụ ndị ga-atụ vootu na ntuliaka a
Ntuliaka a ga-eji họpụta onye ga-abụ onyeisiala mba Gana malitere n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba afọ 2020.
Ihe ruru mmadụ iri na otu gụnyere onye bụ onyeisiala aha ya bụ Nana Akufo-Addo so azọ ọkwa mba ahụ.
Onye ọrụ BBC nọ n'ebe ahụ kọwara na ndị mmadụ pụtara n'ọgbọ ntụliaka kamgbe elekere abụọ nke etiti abalị ịkwụnye n'ahịrị maka ntuliaka ahụ.

A ga-eme ntuliaka a n'ọgbọ ntuliaka ruru puku iri atọ na asatọ n'ogbe iri na isii dị na Ghana.
Onyeisioche Ghana Electoral Commission kwuru na ọ bụ nanị ngalaba ha nwere ikike ịkpọpụta vootu dịka iwu si kwu.

Onyeisiala mba Ghana ugbua bụ Nana Akufo-Addo kwuru na ndị Ghana ekwekwala ka Covid-19 nabichie ha ipụta tụ vootu makana ndị ọrụ nchekwa ga-ememina ndị osochi egbu.
Obere ọgbaghara dapụtara na "City Engineer' polling station dị n'obodo Odododioodoo dị na Ghana

Obere ọgbaghara dapụtara na 'City Engineers polling station, Odododioodoo Constituency' ka ndị na-atụ vootu malitere ịba mba maka etu ụfọdụ si akagbu vootu ha.
Mana ndị ọrụ nchekwa pụtarakwara ozigbo belata ya bụ ọgbaghara.
Ndị ụlọọrụ European Union nọkwa na-enyo ka ya bụ ntuliaka si aga n'ogbe Odododioodoo

European Union Observer Union na-enyo ka ntuliaka si aga na mba n'ogbe Ofododioodoo.
Ha gwara ndị ntaakụkọ okwu dịka ha na-ele etu ihe si aga.









