Ụlọọgwụ ABSUTH n'Aba tọgbọ chakoo dịka gọọmentị ji ndịọrụ ahụike n'Abia ụgwọ ọnwa 18

Absuth

Ebe foto si, Absumedalumni/BBC

Nchọpụta BBC mere gosiri na ụlọọgwụ mahadum Abia steeti, a kpọrọ 'Abia State Teaching Hospital' tọgbọ chakoo n'ihi abụbụ ọrụ ndịọrụ ahụike.

Otu jikọrọ ndịọrụ ahụike a kpọrọ "Joint Health Workers Union" (JOHESU) malitere abụbụ ọrụ n'abalị atọ nke ọnwa Nọvemba.

Iwe ha bụ maka ụgwọọnwa ọnwa iri na asatọ (18 months) nke gọọmentị steeti ahụ ji ha, nakwa akwụghị ụgwọ ezumike nka nke ndị otu ha lara ezumike.

Ha kwukwara na gọọmentị Abia steeti wepụrụ ndịọrụ ahụike n'atụmatụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ha wepụtara.

Abụbụ ọrụ ndị Johesu Abia steeti
Nkọwa foto, Ihe na-ewe ndịọrụ ahụike Abịa steeti iwe

Oge BBC Igbo gara Absuth, anyị chọpụtara na elu na ala tọgbọ chakoo ka ebe a gbara ọsọ agha.

Naanị ndịọrụ nọ ebe ahụ bụ ndị nche olemole, nakwa ụfọdụ ndị ha na onyeisi ụlọọgwụ ahụ na-arụkọ ọrụ.

Ndị nche
Nkọwa foto, Naanị ndịọrụ BBC hụrụ n'ụlọọgwụ ABSUTH bụ ndị nche olemole

Mana onyeisi ụlọọgwụ ahụ bụ Dọkịta Offia Awa Ukonye gwara BBC na ndị dọkịta agbaghị abụbụ ọrụ, kama ọ bụ sọ ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ.

Dkt Ukonye kwukwara na onweghị ihe naanị ndị dọkịta nwere ike imenwu ma ọ bụrụ na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ anọghị ya inyere ha aka.

O kwuru sị: "Oge abụbụ ọrụ ndị Johesu malitere, anyị hapụrụ ndị niile nọ n'ụlọọgwụ ka ha laa".

Ụzọ e si aga ABSUTH
Nkọwa foto, Okporoụzọ Ahia Nkwo-ABSUTH jọgburu onwe ya na njọ

Ukonye kwukwara na ndị isi ụlọọgwụ Absuth nakwa Gọvanọ Okezie Ikpeazu na-enwe ọgbakọ kwa mgbe kwa mgbe iji weta ọnọdụ ahụ n'isi njedebe.

"Gọvanọ ekwetala ịkwụ ndịọrụ ahụ ụgwọ ọnwa isii ruo ọnwa itoolu," Ukonye kwuru.

BBC chọpụtakwara na okporo ụzọ e si aga ụlọọgwụ ahụ jọgburu onwe ya na njọ.

Ogige ụlọọgwụ Absuth
Nkọwa foto, N'ime ogige ụlọọgwụ Absuth dịka ebe a gbara ọsọ
Ihu ọnụụzọ ama (gate) Absuth
Nkọwa foto, Ihu ọnụụzọ ama (gate) Absuth a na-arụ ọhụrụ

Ihe gọọmentị kwuru

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka

Nkọwa foto, Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu

N'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Nọvemba, ka gọọmentị Abia steeti kwuru na ha ehibela kọmiti ga-eleba anya n'ụgwọọnwa niile gọọmentị ji ụfọdụ ndịọrụ steeti ahụ.

Ndịọrụ gọọmentị ji ụgwọ gụnyere:

  • Secondary Education Management Board (SEMB)
  • Abia State University Teaching Hospital Aba
  • Abia State Polytechnic, Aba.
  • Hospitals Management Board (HMB)
  • Abia State College of Education (Technical), Arochukwu.
  • Abia State College of Health and Management Sciences, Aba.

N'akwụkwọ ozi si n'aka Onyebuchi Ememanka, bụ onyeisi mgbasa ozi Gọvanọ Ikpeazu, kọmiti a nwere izuụka abụọ iji rụọ ọrụ ha ma wetara gọvanọ mkpebi ha.

Mana ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ha enweghị ntụkwasị obi n'ebe kọmiti ahụ nọ, n'ihi na ndị niile so na ya bụkwa ndị gọvanọ Ikpeazụ họrọ n'ọrụ.

Ndị mebere kọmiti a gụnyere:

  • Aham Ukoh, Kọmishọna Ego - Onyeisi
  • Onyi Onyii Wamah, onyeisi ndịọrụ gọọmentị Abia steeti
  • Jonathan Osuji, Kọmishọna ahụike
  • Kck Nwangwa, Kọmishọna Agụmakwụkwọ
  • John Okiyi Kalu, Kọmishọna mgbasaozi
  • Kelechi Imeoria - Onyeisi ngụkọ na mgbakọ ego n'Abia steeti
  • Uche Ihediwa - Kọmishọna Ikpe Nkwụmọtọ, nakwa Ọkaikpe kachasị n'Abia steeti