Chronic Respiratory Disorders: Lee etu ị ga-esi gbalahụ 'Asthma', 'sleep apnea' na ọrịa ngụ ndị ọzọ?

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Chioma Mgbemena( ọ bụghị ezi aha ya) dị afọ iri na isii oge ọrịa asthma jidere ya n'ụzọ pụrụ iche, e buga ya ụlọọgwụ ebe a zọtara ndụ ya.

" Etum na isi mmanụ ụgbọala anaghị adị m mma na-ahụ. Oge ọbụla m na-aza ụlọ, imi na-ebido na-agba m maọbụ na-eze uzere aghara aghara mana akpọghị m ya ihe ọbụla."

"Mana ọ bụ oge m dị afọ iri na isii m dara ahụ menyere m egwu n'ahụ ka e buru m gbaga ụlọọgwụ ebe dọkịta chọpụtara na enwere m ọrịa 'asthma."

Mgbemena dị afọ iri atọ ugbua, mana ọrịa ahụ ka na-echere ya aka mgba.

"Ọrịa na-enye m nsogbu ị ga ọrụ n'ihi na enweghị m ụgbọala nke aka m. "

Ọ bụghị ọgbakọ ọbụla ka nwaada Chioma na-ala. Ụfọdụ na-akpachapụ ya n'ihi ọrịa nke mere na ọ naghị agwa ndị mmadụ ọnọdụ ya.

Asthma so otu n'ime ọrịa ndị a kpọrọ 'Chronic Respiratory Diseases' (CRDs).

'Chronic Respiratory Diseases' (CRDs) bụ ọrịa ndị na-emetụta ngụ maọbụ akụkụ ngụ.

Ọrịa ndị na-emetụta ngụ gụnyere ma ewezụga ọrịa asthma gụnyere "chronic obstructive pulmonary disease" (COPD), "Sleep Apnea", "Bronchitis" wdg.

Dịka WHO si kwuo, ọrịa na-emetụta ngụ na-egbu ihe karịrị nde mmadụ anọ kwa afọ gụnyere ndị okenye na ụmụaka.

Kedụ ihe ndị nwere ike ịbute ọrịa ndịa?

Ihe ndị na-ebute ọrịa CRD gụnyere etum,ịṅụ anwụrụ, kemịkal nakwa inwekarị ọrịa ngụ n'efe efe n'ụmụaka.

Dịka Dọkịta Funmi Akinde nke Lagos University Teaching Hospital Luth bụ onye dọkịta ihe na-eme n'ime ahụ doro anya siri kọwaa, lee ihe ụfọdụ na-ebu ọrịa ndị a :

Asthma

Ọrịa 'asthma' bụ ọrịa nke ọwa ikuku na-akpachi, na-akpaghe ma na-ewepụta ụkwara.

Njirimara ọrịa 'asthma' gụnyere; umeọsọ,ụkwara,uwe ịra ahụ,ume ime mkpọtụ na obi mgbu.

Ihe ndị na-ebute asthma bụ;

  • Ọtụtụ mgbe, 'asthma' na-adị n'ezinaụlọ.
  • Ụfọdụ, ọ na-abụ ịnọ ihe na-ebute ya dịka etum, anwụrụ, nsị anụmanụ, nso
  • Oke ibu nwere ike ibuga mmadụ nso ịrịa ọrịa 'asthma'.
  • Ụkwara anaghị ala ala
  • Oke ibu

Chronic Obstructive Pulmonary Disease (COPD)

COPD bụ ọrịa na-ebute mkpochi ngụ nke na ikuku anaghị aga dịka o kwesịrị.

Njirimara 'COPD'

  • Ụkwara na azụzụ
  • Umeọsọ
  • Ume ime mkpọtụ(Wheezing)

Ihe ndị na-ebute'COPD'bụ;

  • Ịṅụ anwụrụ
  • Ikuru anwụrụ n'aka onye na-aṅụ anwụrụ
  • Oke ikuru anwụrụ dịka a na-ahụ na ndị ji nkụ esikarị nri
  • Oke ụkwara na azụzụ

"Obstructive Sleep Apnea"

Nke a bụ ọrịa na-eme ka mmadụ na-ekubi ume ma ọ na-arahụ ụra.

Njirimara 'sleep apnea' gụnyere; ịgwọ ụra,oke ụra n'ehihie, isiọwụwa ụtụtụ, ọbara mgbalielu na ike ọgwụgwụ n'ụtụtụ n'ihi arahụ ụra nke ọma n'abalị.

Ihe ndị na-ebute ya bụ;

  • Ọrịa shuga
  • inwe ogwodo akpịrị buru ibu nke nwere ike ime ka ọwa akpịrị mmadụ kpaa akpa
  • Ọbara mgbalielu
  • Ịṅụ anwụrụ
  • Oke azụzụ
  • Ọrịa shuga

Ọrịa ngụ a na-ebute n'ọrụ

E nwere ọrịa ngụ a na-ebutekarị n'ọrụ nke Bekee kpọrọ "Occupational lung diseases".

Nke na-emetụta ndị na-arụ ebe a na-egwupụta ihe n'ala, ndị na-akụwa okwute, ndị na-ete uhie(painters) maọbụ na-arụ ebe a na-emepụta ụhie nakwa ndị na-arụ ebe a na-emepụta asbetọs.

Dọkịta Funmi Akinde kwuru na" ụfọdụ ndị ka ọrịa na-ebutu ma ha rụọ ọrụ ihe dịka afọ iri maọbụ iri na ise ebe a na-eme ihe ndịa."

Ọ gara n'ihu sị, "Ndị na-azụ ọkụkọ maọbụ nnụnụ 'pigeon' nwere ike ibute ya dịka nsị ha nwere ajọ ikuku si n'ime ya nwere ike imerụrụ ngụ ahụ ma ọ bụrụ na mmadụ echekwaghị onwe ya ọfụma."

z Mgbochi

  • Kwụsị ịṅụ anwụrụ
  • Chọpụta ihe ndị ahụ na-akpalite ọrịa n'ahụ gị ma gbara ha ọsọ.
  • Ọ bụrụ na ị na-ejikarị nkụ esi nri, chọọ ụzọ ọzọ e ji esi nrị anaghị akwụ anwụrụ.
  • Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ ịkwacha osisi, ịzụ ọkụkọ maọbụ nnụ, maọbụ ihe ọbụla na-ebute etu, maọbụ ikuku ọjọ, gbaa mbọ kpuchi imi na ọnụ gị.
  • Gbaa ọgwụ mgbochi oyi ọkpọnangụ(pnemonia)

Ileta onye na-arịa ọrịa ngụ

Ọtụtụ mgbe, a naghị agwọchapụ ọrịa ngụ mana onye nwere ya bụ ọrịa nwegara ihe o kwesịrị ị na-eme iji hụ na ọ kwụ chịm

  • Inwe mmegharịahụ nke Bekee kpọrọ "exercise" kwa mgbe
  • Lezie anya n'ụdị nri ị na-eri n'ihi na ụfọdụ nri na-azakpalite nsogbu ngụ maka onye ọrịa ahụ dị n'ahụ
  • Gba mbọ hụ dọkịta ọkachamara maka ngụ ọbụladị otu ugboro n'afọ
  • Na-aṅụ ọgwụ nleta gị etu dọkịta siri tuziere gị mgbe dum
  • Gbara etu, anwụrụ, ọgwụanwụ na ihe ndị ọzọ na-akusu ọrịa a ọsọ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: