You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu nwagbọghọ si tapụ amụ nwoke dinara ya n'ike
Otu nwagbọghọ a kpọrọ Juanita dị afọ 24 tapụrụ amụ nwoke a sị dinara ya n'ike mgbe nwoke a sị ka ọ ṅụọ ya amụ.
Nke a mere n'obodo Obuasi, Ashanti dị na Ghana mgbe nwoke a batara n'ụlọ nwaghọghọ ahụ n'etiti ime abalị dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Godwin Ahianyo si gwa BBC Pidgin.
Na nkọwa nwagbọghọ a nyere, ọ sị na " nwoke ahụ gwara ya ka ọ ṅụọ ya amụ na ọ bụ mgbe ahụ ka ọ tapụrụ amụ ya."
Nwoke a kpọrọ Emmanuel Ankron dị afọ 23 ji mma na egbe baa n'ụlọ nwata akwụkwọ na. Mgbe o zuchara ego, TV na ekwentị nwaghọghọ a, ọ sị zie ya ṅụọ ya amụ.
Mgbe ọ tapụchara amụ nwoke, o bu ọbara si n'ụlọ nwagbọghọ gbapụta n'ezi.
Juanita mere mkpesa n'aka ndị uweojii ma gaa n'ụlọọgwụ 'Anglogold Ashanti bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ. O mechara chọpụta na nwoke ahụ bịakwa n'ụlọọgwụ ahụ ịnata ọgwụgwọ ma tie mkpu sị ka a nwuchie ya.
Ndị uweojii tụtụtara mpaghara amụ ahụ a tapụrụ dịka nyocha ka na-aga n'ihu.
Ndị uweojii sị na nwoke dinachara nwaanyị ma gwazie ya ṅụọ ya amụ, na ọ bụ mgbe ahụ ka nwagbọghọ a tapụrụ amụ ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: