Foot Ailments: Lee ọrịa ụkwụ ndị a na etu ị ga-esi gwọ ha

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Akụkụ ahụ niile dị mkpa mana o nwere ndị ka ibe ya mkpa.

Iji maatụ ụkwụ mmadụ - ọ bụ ụkwụ mmadụ bụ na mmadụ na-akwụ ọtọ, na-aga ije, agba ọsọ, akpata ego ndz.

Ugbua anyị ga-elebanye anya n'ọtụtụ ọrịa na-enye ụkwụ mmadụ nsogbu na etu ị ga-esi gbalahụ ya.

Ụfọdụ nwereike ịnwe ọrịa a mana ha agaghị a ma ya mana lee ihe otu dọkịta bụ Obinna Obuka gwara anyị maka ya.

Ihe ọzọ pụtara na ya bụ okwu bụ na ụdịrị akpụụkwụ mmadụ na-eyi, ọ kachasị ụmụ nwaanyị na-eso akpata ọrịa n'ụkwụ.

Lee ụfọdụ ọrịa ahụ ebe a:

1.Mgbawara ụkwụ

Ọrịa a bụ nke Bekee kpọrọ 'Athelete's foot' dịka dọkịta Obinna si kọwaa bụ ọrịa nje akpọrọ 'Fungi' na-ebute.

"Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ naanị n'etiti mkpịsị ụkwụ ka ọrịa a na-apụta mana ọ bụghị eziokwu" ka o kwuru.

"O nwereike ị pụta ebe ọ bụla n'ụkwụ mmadụ ma na-emetụkarị ndị ime ahụ ha esighi ike".

O kwuru na ụzọ a ga-esi gwọ ya bụ iji "Clotrimazole na ketoconazole".

2. Ọtịtọ mkpịsị ụkwụ bụ "Corn"

Webụsaịt NHS bụ ngalaba ahụike nke mba Ingland kọwara ọrịa a dịka "akpụkpa ahụ gbara ọkpụrụkpụ siri ike"

Ha kọwara na o nwereike ọ gaghị afụ ụfụ mana ọ dị mma ịtinye anya ebe ọ nọ.

Ihe kachasị ebute ya bụ ọrịa bụ mmadụ ịyi akpụkpụ ụkwụ abaghị onye ahụ maọbụ na-afụ ụfụ.

Ihe ndị ị ga-eme ị kwụsị ya gụnyere:

  • Ịchịnye ụkwụ n'ime mmiri dị obere ọkụ ka o nweike gbasaa
  • Ịte ude na-agba mmiri n'ụkwụ gị oge niile
  • Ịyi "socks" esighi ike iji jide ụwkụ gị ọfụma
  • Ịyi akpụkpụ ụkwụ buru ibu n'enweghi akpọọla

3. Akpụrụ ụkwụ bụ 'Bunions'

Akpụrụ na-eme mmadụ n'ụkwụ mgbe otito nwere ọkpụkpụ n'ime ya na-eto n'akụkụ mkpịsị ụkwụ kachasị ma mee ya ka ọ gbagọọ.

O nwereike ị na-acha ọbara ọbara ma na-afụ ezigbo ụfụ. Ọ bụkwa ọrịa ọzọ na-abịa site n'iyi akpụkwụ anaghị gị.

Ihe ndị ọzọ na-ebute ya bụ akpola, agbụrụ mmadụ nakwa ọrịa mgbujiri na-eme na njiko ọkpụkpụ.

Uzo e si agwọ ya bụ iyi akpụkpụ ụkwụ bara gị ọfụma. ịnụ ọgwụ na-akwụsị mgbu.

Dọkịta Obinna kwukwara na "ị nwereike waa ahụ maọbụrụ na mgbu karịa n'ụkwụ ahụ".

Gịnị na-ebutekarị ọrịa ndị a?

Dọkịta Obinna kọwara na ọtụtụ ọrịa ndị a si n'ụdịrị akpụkpụ ụkwụ ndị mmadụ na-eyi

"Ọkwa ị ma na ihe ndị a bụ mmadụ ị na-afanye ụkwụ ebe ọ baghị na-ebute ha" ka o kwuru.