You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mmanụ nri na ihe ndị ọzọ a a na-emebi nsị n'ezie?
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
O nwere ọgụgwọ gbatagbata dị icheiche ndị Igbo ji agwọ mmerụ ahụ nakwa iri nsị tupu e nweike nye mmadụ ọgwụgwọ juru afọ kemgbe ụwa gboo.
Ụfọdụ n'ime ha gụnyere mmanụ nri, aki ilu, akwụ ojukwu, akụoyibo, mmiri nnu nakwa ahịahịa dị icheiche.
Mana kedụ ụdịrị ike ihe ndị a nwere n'ebe ọgwụgwọ nke Bekee nọ? Ọ bụ eziokwu na mmanụ nri na-azọ ndụ onye riri nsị?
Dọkịta Nkolika Nwankwo kọwara na ọgwụgwọ gbatagbata ọbụla a na-enye onye ṅụrụ maọbụ rịe nsị metụtara ihe atọ:
- - Onye riri nsị (ọ bụ okenye ka ọ bụ nwata?)
- - Ụdịrị nsị onye ahụ riri (Ọ bụ kemịkalụ ka ọ bụ ihe dịka ịṅụfee ọgwụ oke)
- - Oge e ji nye ya ọgwụgwọ gbatagbata
- - Mmadụ a ma ụma rie nsị ka ọ na ọ maghị ụma
Lekwa ihe anyị chọpụtara dịka anyị gbara otu onye dibia mgbọrọgwụ na dibia Bekee ajụjụ ọnụ gbasara ihe ndị a.
Mmanụ nri
Otu onye ma anya mgbọrọgwụ ndị Igbo ji agwọ onwe ha kemgbe oge gboo bụ Duruagwu nke abụọ gwara BBC Igbo na mmanụ nri bụ otu ihe eji agwọ nsị
O kwuru na ya na ụfọdụ ihe ndị ọzọ bụ ihe ndị Igbo na-enye mmadụ gbatagbata tupu e nweike gwọọ onye ahụ ọfụma.
N'otu aka ahụ Dọkịta Nkolika Nwankwo gwara BBC na o nweghi ihe akaebe gosiri na mmanụ na-azọ ndị onye riri nsị
O kọwara sị "mmanụ nwereike ịkpuchi anụ ahụ dị n'ime afọ mmadụ maka etu o si lọọ alọ nke ga-eme na ọ bụrụ na mmadụ rie maọbụ ṅụọ nsị, naaanị afọ nkịtị ga-asa ya maọbụ ọ gbọọ agbọ
Mana ọ bụrụkwa maka ịgbu nsị dị n'ime ahụ mmadụ, ọ naghị eme nke a.
Akụoyibo
Duruagwu kwukwara na e ji mmiri akụoyibo agwọ ndị riri nsị n'ụzọ ọbụla ọ bụ.
O kwuru na ihe mmiri akụoyibo ji dị mkpa bụ na "o nwere anya atọ nke ndị ichie na ndị amosu na-eji ele anyị anya".
Mana Dọkịta Nwankwo kwuru na o nweghi ihe akaebe n'ọgwụgwọ Bekee gosiri na akụoyibo maọbụ mmiri na-agwọ onye riri nsị
Kama ọ kọwara na mmiri akụoyibo na-enye ike n'ihi na o nwere ihe sayensị kpọrọ "electrolytes" na-enye mmadụ ike.
O kwuru sị "ikekwe onye riri nsị na-agbọ agbọọ, ike ga na-agwụ ya mana enye onye ahụ mmiri akụoyibo, ọ ga-eme ka ahụ situ ya ike mana ọ gaghị emebi nsị onye ahụ riri"
Aki ilu
Ihe ọzọ Duruagwu kpọpụtara e ji agwọ nsị enyere mmadụ bụ aki ilu maọbụ ugoro.
Dọkịta Nwankwo kwuru na nke a abụghị eziokwu n'ihi na aki ilu bụ mkpụrụ osisi nọrọ onwe ya.
"A ghọtara m na ụfọdụ ndị ọdịnala kwenyere n'ike aki ilu nwere mana ahụtabeghị m ebe o gwọrọ onye riri nsị na ndụ m chaa chaa" ka o kwuru.
Ihe ndị ọzọ pụtara n'okwu a
Duruagwu kwuru na o nwere ihe Igbo na-akpọ udu nke a na-enye onye riri nsị iji zọọ ndụ ya.
O kwuru na ọ na-eme ka onye ahụ gbọpụta nsị ahụ o riri.
Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ihe ndị a na-etinye n'ime udu ahụ o kwuru na ọ bụ: akwụ ojukwu dị ndụ, mmiri nkịtị dị ọcha, aki ilu na mkpụrụ anya nnụnụ ndz.
O kwukwara na o gaghaị akpọpụta ihe ndị dị n'ime udu ahụ n'ihi na ọ pụtara ịgba ama n'ọrụ aka ya.
Unyi nkiti (Activated charcoal)
Dọkịta Nwankwo kwuru na ihe ụlọọgwụ niile ji agwọ ndị riri maọbụ ṅụọ nsị bụ ụnyi nke Bekee kpọrọ "Activated charcoal"
O kwuru na ọrụ ya n'ime ahụ bụ ịkpuchi nsị ahụ ka ọ ghara ịmetụta ime ahụ mmadụ maọbụ merụọ mmadụ ahụ n'ime ahụ rue mgbe mmadụ ka anyụpụ ya.
"O metụtakwara oge e ji bute onye ahụ n'ụlọọgwụ maọbụ chọpụta na onye ahụ riri nsị n'ihi na ka oge na-aga, ka ọrụ unyi ahụ nwereike ịrụ n'ime ahụ na-agbada"
Ihe ọzọ o ji ma atụ eji agwọ ndị riri maọbụ ṅụọ nsị bụ ịsachapụ afọ mmadụ nke bụ "stomach pumping" na Bekee.
Etu e si mee ya bụ ịwunye mmadụ mmiri dị ọcha n'afọ ma mipụtakwa ya n'iji paịpụ e si n'ime imi mmadụ tinye n'ime afọ.
Usoro ịsachapụ ime afọ abụghị nsị niile ka-eji ya agwọ n'ihi na o nwere ụfọdụ kemịkalụ siri ike ga-emerụ mmadụ ahụ ma a nwaa iji usoro ahụ ewepụta ya.