You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye hụrụ ube rachawa ya, anaghị ahụ ụbe kwa daa
Kedụ ebe i so; i so na ndị na ndị na-ara ube ara ka i so na ndị na-aracha ya aracha?
Ube bụ mkpụrụ osisi Chineke nyere ndị Afrịka.
Dịka ihe nile nwere oge, oge ube bụ onwa Juun rue ngwucha ọnwa Sepụtemba kwa afọ.
Osisi ube na-eji ihe ruru ọnwa abụọ na ise amị okooko (flower) ya.
Ube na-atọchị ntị ma e jiri ọka taa ya
Mgbe nke a mechere, ọ na-amalite ịmị mkpụrụ ya na mbido udummiri.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụta ube ka mkpụrụosisi e ji emegharị ọnụ mana n'ezie, ube karịrị nke a.
Ube na-enye ọtụtụ ihe na-edozi ahụ ma na-enyekwa ahụ ihe.
Ya kpatara o ji dị mkpa ịracha ube nke ọma n'oge ya.
Gịnị ka ube na-enye n'ahụ?
- Ube na-agbacha ọnụ ma na-ewepụkwa ọnụisi. O nwere akụrụngwa na-egbu nje na-ebute ọnụisi.
- Ube nwere 'vitamin C na E' bụ nke na-enye aka igbochi ọrịa kansa. 'Vitamin' ndị a na-enyekwa aka ime ka anụ ahụ mmadụ na-amụke amụke ma chụkwa nka ahụ ọsọ ụkwụ eruala.
- O nwekwara ụmụ akụrụngwa ndị ọzo na-enye ahụ ike dịka niacin, thiamine, magnesium, pantothenate folate, potassium, calcium, amino acids, fibre, phosphorus, riboflavin, carbohydrates nakwa vitamin B6.
- Ube na-enye aka igbochi ọbara mgbalielu bụ nke na-akpalite mkpọnwụ ahụ maọbụ mba agbara.
- 'Fiber' dị na ya na-akwusị afọ okuko ma mekwa ka mposi na-aga werewere.
- Ọ na-emekwa ka eze na ukwueze gbasie ike.
- Ube na-egbochị nwaanyị ibute ọrịa kansa mgbe nsọ biri.
- Ọ na agwọkwa akpụkpa, nkwọ ahụ nakwa kọrọkọrọ
- Onweghị ihe ọjọọ ube na-eme n'ahụ ma a racha ya maọbụ te ya ete.
Ya bụ onye hụrụ ube rachawa ya na-adịghị ahụ ube kwa daa.