You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Oge udummiri: Ihe iri i kwesiri ime iji chekwaa onwe gị
O ruola oge ahụ ahụ na-eju mmadụ oyi, ukwu osisi na-ekewapụta gbaa ma ndị mma na-agba ọgụ na mma n'aka banye n'ugbo.
Echefukwala na ọ bụ oge a ka akwụkwọ nri na-abụ atụrụ taba, mkpụrụ osisi na-ada ọnụala nke bụ na onye ọbụla ga-egoli ya inye onye ọbụla ohere iri nri na-edozi ahụ.
Ihe ndị a niile bụ ihe na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ maka oge udu mmiri mana o bukwa ihe na-eche aka mgba nke ya abịa.
Ọrịa na-adị ire n'oge udu mmiri:
- Ọrịa oyi: Dịka mmiri na-ezo, ọ na-eme ka ahụ na-eju mmadụ oyi mana o nwere ebe ahụ iju oyi a ga-eru, ọ bụrụ nsogbu. Ụdị oyi nwereike ibute ọrịa oyi nke ndị bekee na-akpọ "Pneumonia". Yichie ahụ gị ma ị chọọ ịlaba ma
- Ọrịa ịba site n'anwụnta: Ndị nyocha ahụike ekwuola na otu ihe na-ebute ọrịa ịba bụ anwụnta.
Onye ọkachamara n'okwu ahụike n'ụlọakwụkwọ ahụike UNTH Enugwu bụ Dọkịnta Chuka Agunwa kọwara udi ọrịa na-adị ire na etu ndị mmadụ ga-esi chekwaa onwe ha.
Gere ihe o kwuru;
Ihe 10 i kwesiri ime iji chekwaa onwe gị
- Sie mmiri ị na-aṅụ n'ọkụ: Kpachara anya ụdị mmiri ị na-aṅụ n'oge a. Ọ bụrụ na ị maghị ebe mmiri i na-aṅụ si, lebaa ya anya maka ọrịa. Ugbua mmiri na-ezo, mmiri ozuzo na-asọpụta si na ọwa mmiri, n'elu ụlọ na ebe ndị ọzọ, gbaa mbọ hụ na ị naghị aṅụ mmiri ị maghị etu e si chuta ya maọbụ chekwaa ya
- Jiri nche anwụ na-agagharị maka ịmaghị ebe mmiri ga-ejide gị. Ihe a bụ oge mmiri ozuzo, mmadụ agahị ejideli mmiri aka ka ọ ghara izo mana ihe i nwereike ime bụ ịdị nkwadebe oge ọbụla ka ọ bụrụ na ebe ọbụla ị nọ mmiri bido izo, ọ gaghị ama gị
- Yiri akwa oyi na akwa na-echekwa mmiri: N'oge a mmiri na-ezo, ịchọghị ka azụzụ na ụkwara kutuo gị maọbụ oyi ịba gị ahụ. Ọ bụ eziokwu na ahụ iji oyi mmiri ozuzo na-atọ ụtọ mana uche gị ga-adịkwa ya maka oyi ịba gị ahụ. Yiri akwa na-ekpuchi oyi na akpụkpọụkwụ ga-echekwa ụkwụ gị nke ọma
- Tinye akwa mgbochi anwụnta n'akwa gị: Ugbua mmiri na-ezo, mmiri na-adọ n'akụkụ ụlọ n'ọwa mmiri nke na-eme na anwụnta na-amụba n'oge a. Cheta na ndị ahụike kwuru na anwụnta bụkarịsịrị ihe na-ebute ịba mana akwa mgbochi anwụnta ga-echekwa gị na ezinaụlọ site n'anwụnta nakwa site n'ọrịa iba
- Tufuo ahịhịa gị nke ọma ma mepee ọwara mmiri niile: Ọ bụrụ na ịchọghị ka i tete ụra n'ụtụtụ hụụ na ị nọ n'elu mmiri, na mmiri eburula gị na akwa gị, gbaa mbọ hụ na ị na-etufu ahịhịa gị nkeọma ma na-ehicha gburugburu gị. Ọ bụrụ na i bi nso na mbuze, uche gị dịkwa ya maka ala ilo gị. Arụkwala ụlọ n'ụzọ mmiri maka mbuze
- Gbanyụọ ọkụ gị ma ọ bụrụ na ijighi ya eme ihe ọbụla. Amụma nwereike ise n'ike ma metụ eriri ọkụ latric, ọbụrụ na i gbanyụghị ọkụ gị, nke a nwereike ikpali ọkụ ọgbụgba
- Jide ọkụ ma ị na-aga n'abalị: Ahịhịa na-eto ebe niile ugbua maka ọtụtụ mmiri juru n'ala, i nwereike ịhụ agwọ maọbụ akpị si n'ọhịa maọbụ kpuru ekpu. Kpachara anya maka agwọ ịta gị maọbụ akpị ịgba gị
- Gbaa ọgwụ agwọ na akpị na gburugburu gị iji chụụ ha ọsọ
- Mezie elu ụlọ gị na-eri mmiri ka ụlọ gị ghara ide mmiri. Mezikwa ihe nhicha mmiri n'ụgbọala gị maka mmiri izobido gị n'ụzọ
- Abanyela n'ide mmiri ọbụla: Ide mmiri bụ ihe ize ndụ dị oke egwu, etinyela ụkwụ maọbụ ụgbọala gị na ya maka na ọ na-ebu mmadụ. Ọ bụkwara na i bi ebe dị ala ide mmiri nwereike ibu, gaa n'elu ala gaa biri rue mgbe mmiri bịasịrị.
Ndị ọrụ ugbo
Otu ihe pụtara ihe a na-eme n'oge mmiri ozuzo bụ ịkọ ụgbọ. Ugbua ka ọka na ube dị ọkụ na-eju ebe niile.
Mana ihe dị mkpa ndị ọrụ ugbo kwesiri ịma bụ na ha ga-akpachara anya maka ogbunigwe e liri n'ala n'oge gara aga.
Cheta na oge agha, e liri ogbunigwe n'ime ala e ji lụọ agha ahụ mana n'oge a mmiri na-ezo, o na-emepesi onunu ebe e liri ihe ndị a.
Onye na-akọ ugbo nwekwara ike na-egbuwa ala ma gbute ya, ya bụ kpachara anya ma i gbute ihe ọbụla bụ igwe n'ala.
Ọ bụụ na ị maghị ihe ọ bụ, kpọọ ndị uweojii ka ha nyochaa ya.
Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu kwuru ka onye ọbụla na-ebuwa ala ma ọ na-akọ ugbo ma ọ na-arụ ụlọ maọbụ ụzọ gbachara anya.
O kwuru ka onye ọbụla kụtara ihe n'igwe ọ na-amaghị kpọtụrụ ndị uweojii.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: