Justice Chukwudifu Oputa: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwoke ike a

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ị nụla maka Charly Boy, mana kedụ ihe ị ma maka nna ya?

Charly Boy bụ otiegwu a ma ama na onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị na Naịjirịa, mana ị ma na nna ya kpakwara ezigbo ike oge ọ dị ndụ?

Ọkaikpe Chukwudifu Oputa mere ọtụtụ ihe e ji echeta ya n'agbanyeghi na o teela ọ nwụrụ.

A bịa n'ihe gbasara iwu obodo, ide akwụkwọ, ikuzi nkuzi, kpọọ ya aha, o mechara ha niile.

Ihe ị kwesịrị ịma gbasara nwoke a wuru ewu na Naịjirịa

  • Aha ya bụ Chukwudifu Akunne Sylvester Oputa
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Septemba 1916, n'obodo Ụmụdei dị n'Ugwuta dị n'Imo steeti
  • E zigara ya na nke onye nkuzi a na-akpọ Maazị Azuwuike (Ọ gwara ụmụ ya na onye nkuzi a bụ otu onye o nwere na ndụ ya ọ na-enweghi ike ichefu), ebe ọ nọ gaa ụlọakwụkwọ sekọndịrị
  • O si ebe ahụ gaa Yaba Higher College tupu ọ gaa Achimota college dị na mba Gana, oge agha mbaụwa nke abụọ malitere, ebe ahụ ka ọ gụrụ 'Economics'
  • O si ebe ahụ gaa London, ebe ọ nọ gụọ maka ihe mere mgbe gboo nke Bekee kpọrọ History, o mechara gụọ iwu (Law) ma gaa nke a na-akpọ "law school" na mba ahụ, ebe a nọ nye ya ikike ịrụ ọrụ dịka onye ọkaiwu n'afọ 1953
  • Ọ kwụsịghị ebe ahụ, ọ lọtakwara Naịjirịa bịa mepee ụlọọrụ ndị ọkaiwu ebe ọ rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ
  • O kpere ọtụtụ ikpe gbara ọkpụrụkpụ, nke gụnyere okwu echichi pụtara n'Ugwuta n'afọ 1959 nakwa nke ndị Amayenabo nke ndị Rivas steeti n'afọ 1960
  • N'afọ 1966 e mere ya Ọkaikpe nke Ụlọikpe ukwu nke dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ
  • N'afọ 1976, e bulie ya n'ọkwa, mee ya ọkaikpe kachasị nke Imo steeti
  • N'afọ 1984, e mere ya Ọkaikpe ndị Ụlọikpe kachasị na Naịjiria, bụ ebe ọ rụrụ afọ ise tupu ọ laa ezumike nka n'afọ 1989
  • Onyeisiala Olusegun Obasanjo si n'ezumike nka kpọpụta ya ịbịa nọrọ n'isioche ihe a kpọrọ "Oputa panel" bụ maka nnyocha ikike dịrị onye n'oge ọchịchị ndị agha site n'afọ 1984 ruo afọ 1999 (Human Rights Violation Investigation Commission of Nigeria)
  • O dere ma biputa ọtụtụ akwụkwọ karịrị iri anọ, bụ ihe ọ nọ na-arụ n'ọtụtụ afọ ndị ahụ ọ lachara ezumike nka tupu Obasanjo akpọghachị ya ọrụ
  • Ọ kwụsịghịkwa ikuzi nkuzi, n'ihi na inyefe ndị mmadụ amamihe o nwere masịrị ya nke ukwu
  • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Margaret Ntianu Oputa, ma mụọ ụmụ ise, nke otu n'ime ha bụ Charles 'Charly Boy' Oputa, otiegwu a ma ama, nwa ya ọzọ sorokwara nzọmụkwụ ya wee bụrụ ọkaiwu
  • Etu nwa ya bụ Charly Boy si kwuo, ọ bụ nwunye Maazị Chukwudifu gbasiri mbọ ike ịhụ na o mechara bụrụ Ọkpaikpe
  • Oge ọ dị ndụ, e chiri ya echichi 'Ogbuagu'
  • Otu ihe o jighi gwuo egwu na ndụ ya bụ ihe gbasara Chukwu nakwa okpukperechi; o bu ihe gbasara ụka Katọlik n'isi
  • Onye ndu ndị Katọlik nke bụ Poopu ji aka ya chie ya echichi Knight, e chiri ya Knight of St. Mulumba, Knight commander of St. Gregory the great nakwa Knight of St.Sylvester
  • O so n'otu n'ime ndị lụrụ agha Burma
  • Ọ nwụrụ ka ọ dị afọ 98, n'ụbọchị anọ nke ọnwa Mee 2014 ka ọ rịaturu nwaobere ọrịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: