Roxy Ogechi Ndebumadu nwada Igbo bụ onyeisi okpuruọchịchị Bowie n'Amerịka
Nwada Igbo aha ya bụ Roxy Ogechi Ndebumadu kọọrọ BBC Igbo etu njem ya n'ịzọ ọkwa onyeisi okpuruọchịchị Bowie nke Maryland, mba Amerịka.
Ọ gụrụ akwụkwọ na ngalaba Kọmputa Sayensị tupu ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Nwada a dị afọ 27 ugbua sị na ọ zọrọ ọkwa mgbe ọ dị afọ 26 ma merie n'agbanyeghi na mmadụ anọ ọzọ so ya zọọ ọkwa tọchara atọ.
Ndebumadu sị na ihe mere o ji malite ịzọ ọkwa a bụ ka o nyere ndị ọ na-esiri ike aka n'obodo ahụ.
Ọ sị na ọ malitere ịchụ nta vootu naanị otu ọnwa tupu e mee ntuliaka nyere ya mmeri.
Kirie ihe o kwuru n'uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Chimamaka Ihenacho na Nnamdi Agbanelo



