You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Imo Pension Fraud: Lee ndị gọọmentị sị na-ezu ụgwọ ọnwa ezumike nka n'Imo Steeti
Gọomentị Imo Steetị ewepụtala aha mmadụ asatọ ha sị na-eri ụgwọ ọnwa ndị lara ezumike nka na steetị ahụ.
Nke a dị n'ozi ha wepụtara n'akara Twitter n'ụbọchị ise nke ọnwa Julaị, 2020.
Gọọmentị Imo sị na mmadụ asatọ a riri ego dị nde narị naịra atọ na iri atọ na atọ N330m n'ime otu afọ.
Lee aha ndị a naego ole ha riri
Ajokubi H. A nọ n'ogogo iri na ise na-eri ego dị (N5,473,790.92) kwa ọnwa, na-eri (N65,685,497.00) kwa afọ.
Njoku Damian nọ n'ogogo iri na ise na-eri ego dị (N5,042,439.58) kwa ọnwa, na-eri (N60,509,275.00) kwa afọ.
Obasi Canice nọ n'ogogo iri na isii na-eri ego dị (3,460,366.64) kwa ọnwa, na-eri (N41,524,399.60) kwa afọ.
Anyanwụ, F. N n'ogogo iri na anọ na-eri ego dị (N3,150,336.00) kwa ọnwa, na-eri (N37,804,032.00) kwa afọ.
Emenalo, Theresa na-eri ego dị (N3,058,592,00) kwa ọnwa, na-eri (N36,703,010.00) kwa afọ.
Joan Sunday nọ n'ogogo iri na anọ na-eri ego dị (N2,320,624.00) kwa ọnwa, na-eri (N27,847,488.00) kwa afọ.
Ajaegbo, E. O. n'ogogo iri na anọ na-eri ego dị (N2,298,910.34) kwa ọnwa, na-eri (N27,586,924.10) kwa afọ.
Ekedere, Eunice n'ogogo iri na anọ na-eri ego dị (N2,707,501.33) kwa ọnwa, na-eri (N32,490,016.00) kwa afọ.
Nyocha gọọmentị mere sị mmadụ karịrị otu puku larala ezumike nka kamgbe afọ 1976 ka na-anata ụgwọ ezumike nka rute ugbua.
Ọzọ kwa bụ na onye ọkaipke lara ezumike nka na-eri ego puku narị atọ kwa ọnwa bụ nke karịrị ego o kwesịrị iri.
Onye bụbu odeakwụkwọ gọọmentị nwụrụ anwụ ka na-eri ụgwọ ezumike nka rute ugbua.
Nke a na-abịa dịka gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodinma ṅụrụ iyi na ọ ga-ewepụta aha ndị mere nrụrụaka n'ụgwọ ezumike nka.
Cheta na ndị lara ezumike nka n'Imo Steetị mere ngagharịiwe maka akwụghị ha ụgwọ kamgbe gọvanọ Hope Uzodinma bara n'ọchịchị.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru gọvanọ Hope Uzodinma bụ Oguiwike Nwachukwu ichọpụta etu ha si mee nyocha a, ọ sị na ọ dịghị ya n'aka ịza ajụjụ a.
N'otu aka a kpọkwara kọmishịọna mgbasaozi n'Imo State bụ Declan Emelumba Uzodimma mana ọ zaghị ekwentị ya.
Mana mgbe a kpọrọ onyeisioche otu jikọtara ndị lara ezumike nka, ngalaba Imo Steetị bụ Josiah B. Ugochukwu, ọ sị na ọ hụbeghi aha ndị a gọọmentị wepụtara.
Ugochukwu sị na ọ ga-etinye ọnụ n'okwu a mgbe ọ hụchara akwụkwọ ozi bu aha ndị a.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: