Coronavirus Symptoms: Ọ bụrụ na ị naghị anụ ụtọ nri maọbụ isi, i nwereike ibu coronavirus

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ha anaghị anụ isi maọbụ ụtọ nri na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ugbua nke mere ka ụfọdụ na-ekwu na ọrịa coronavirus abala obodo n'ike.

Anaghị anụ isi maọbụ ụtọ ihe bụ otu njirimara ọrịa coronavirus nke na-egosi na-ahụ ndị ụfọdụ ọrịa ahụ ji.

Site Ọnịcha gawa Abakaliki, ndị mmadụ na-ekwu na ha rịara ọrịa nke gụnyere anaghị anụ ụtọ na isi ihe ọbụla.

Uche Nwonwu bụ onye Enugwu gwara BBC Igbo na kemgbe abalị ise ya anụbeghị ụtọ ihe maọbụ isi ihe.

Ọ sị: "Ihe a malitere ubọchị ụka. Dịka ọ na-eme m, ewetere m akpụ nso n'ime m mana anụghị m isi ya."

Nwonwu gakwara n'ihu kwuo na ọ bughị sọsọ ihe a na-eme ya.

"Isi na-awa m, ahu ọkụ na-emekwa m. Azụzụ na-asụchị m imi n'abalị ebe ike na-agwụkarị m."

Nwaada Nwonwu no n'ime obodo, nke pụtara na ebe gọọmentị hibere ka a na-eme nyocha ma mmadu ebu coronavirus adịghi ya nso.

Ọ gwakwara BBC na ọbụghị sọsọ ya ka ụdịrị ihe a na-eme n'obodo o bi.

"Otu enyi m gwara m na ihe dị otu a mere ya. Ụfọdụ ndị nọ ebe m gara igo ọgwụ sịkwa na o mere ha."

Chidiebere Ike bụ onye na-ere ọgwụ n'Aba gwara BBC na ya bụ ihe a na-akọ akụkọ ya doro ya anya ọfụma dịka ya rịara ya ma zute ya dịka ọ na-atụ mgbere ya.

Maazị Ike sị: "Anyị erebeghi ọgwụ ịba ruo etu anyị siri ree ya site n'ọnwa Mee ruo Juun."

"Nke a bụ maka na ọtụtụ mmadụ na-ewete ama ọrịa ịba n'ahụ ha.

"Ama ndị a gụnyere isi ọwụwa na ahụ ọkụ. N'otu aka ahụ, ọtụtụ mmadụ na-ekwukwa na ha anaghị anụ isi maọbụ ụtọ nri."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya hụrụ ụdịrị ama n'ahụ ya nakwa nke ezinaụlọ ya.

"O mere m ruo abalị iri ise ma mekwa ndị be m. Emekwara m nnyocha iji mata ihe ọ bụ mana a hụghị nke 'malaria' maọbụ 'typhoid' n'ahụ m."

Na soshal midia ọtụtụ mmadụ kwenyekwere na ha hụrụ ụdịrị ihe maọbụ na omere ha.

Ihe ọ bụ njirimara coronavirus?

Dọkịnta Nneoma Sibigam gwara BBC na ihe a ndị mmadụ na-ekwu na-eme ha dịka ka ama coronavirus.

"Ihe ọhụru a gwara anyị banyere coronavirus bụ na ọ na-eme ka ndị mmadụ ghara ịnụ isi na ụtọ ihe. Nke mere na o nwereike bụrụ nje ka ndị bu."

Dọkịnta Sigibam sị ka ndị nwere ụdịrị ama gaa ebe gọọmentị hibere maka nyocha coronavirus.

Ọ sịkwa na ihe a agaghị abụ ịba maọbụ azụzụ makana ịba na azụzụ anaghị eme ka mmadụ gharị ịnụ isi na ụtọ ihe kpam kpam.

Ihe ị ga-eme na ịhu onweghi n'ọnọdụ a

Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na anaghị anụ ụtọ maọbụ isi bụ otu njirimara coronavirus.

Ha sị onye ọbụla hụru onwe ya n'ọnọdụ a kwesịrị ịkpọ ekwentị ndị na-ebuso coronavirus agha na steeti ebe ha nọ.

Ngalaba NCDC wepụtekwara akara ndị ekwesiri ịkpọ banyere ihe a na steeti dị iche iche. Leekwa ebe akara ekwentị ndị a dị.

Ka ọ kwụ ugbua, ihe karịrị mmadụ puku iri abuọ na asaa ebutela coronavirus na Naịjirịa ebe mmadụ 616 anwụọla.

Agbanyeghị na ụfọdụ mba dị ka Chaịna na ụfọdụ mpaghara Yurop ahụra mbelata ọrịa a, Naịjirịa ka so na mba ndị ọ ka na-abanwanye.