Interally generated Revenue: Lekwa steeti kacha akpata ego na dị owu na-asa na Naịjirịa

N'akwụkwọ ndị National Bureau of Statistics (NBS) biputara e gosila steeti bụ ide ego na ngwụcha afọ 2019.

Na ya bụ akwụkwọ ha biputara n'ụbọchị Frịade, Legọs steeti bụ ndị mbụ n'ịgbata ego n'onwe ha.

Ha ji ihe ruru ijeri Naịra narị atọ na iri itoolu na asatọ, nde narị asaa, iri atọ na abụọ, puku narị abụọ iri anọ na isii, narị anọ iri itoolu na atọ na kobo iri atọ na asatọ (N398,732,246,493.39) were bụrụ ndị mbụ (1).

River steeti ji otu narị ijere, na iri anọ, narị nde atọ na iri itoolu na asatọ, na puku asaa na iri anọ na anọ, na narị atọ na abụọ, na kobo iri asaa (N140, 398, 744, 302.70) were gbaa ndị nke abụọ (2).

Abuja jiri ijeri iri asaa na anọ, nde narị ise na iri isii na anọ, otu narị puku na iri asatọ, narị asatọ na iri atọ na ise, na kobo iri atọ na otu (N74,564,180,835.31) were sowe ha dịka ndị atọ.

Steeti mbụ n'alaigbo bịawara nso bụ Enugwu steeti bụ ndị ji ijeri iri atọ na otu, nde iri isii na itoolu, puku narị anọ na iri isii na isii, na narị itoolu na iri na atọ (N31,069,466,913.00) were gbaa ndị nke itoolu (9).

Anambra steeti were ijeri iri abụọ na isii, puku narị atọ iri isii na itoolu, otu puku na narị itollu na ise, narị asatọ na iri asatọ na abụọ, kobo iri asatọ na itoolu (N26,369,195,864.89) gbaa ndị nke iri na anọ (14).

Imo ji ijeri Naịra iri na isii, nde iri itoolu na ise, puku narị abụọ iri itoolu na itoolu, narị irii na iri abụọ. kobo iri ise na itoolu (N16,095,299,620.59) agba ndị nke iri abụọ na abụọ (22).

Abia steeti werezia ijeri Naịra iri na anọ, nde narị asaa na iri isii na itoolu, puku narị atọ na asaa, narị isii na iri ise na asatọ na kobo iri ise na ise (N14,769,307,658.56) gbaa ndị nke iri abụọ na anọ (24).

Ebe Ebonyi steeti ji ijeri asaa, nde narị anọ iri ise na ise, puku narị abụọ iri itoolu na anọ, narị isii na iri asaa na isii na kobo iri ise na itoolu (N7,455,294,676.59) na agba ọnyụpa n'azụ ha dịka ndị iri atọ na isii (36).

Ndị bu klasị n'isi n'ịkpatara onwe ha ego na Naịjrịa bụ ndị Taraba steeti bụ ndị nwetere ijeri Naịra isii na ụma.

Akụkọ ga-amasi gị