You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra steeti: 'Nọọsụ eboro ebubo izu nwa n'Anambra steeti ezughi nwa' - Ndị uweojii
Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gbasara nọọsụ ku nwaọhụrụ ndị mmadụ gbara okirikiri ezughi nwa ahụ ezu.
Ihe mere na ya bụ ihe onyonyo gosiri na a na-ebo ya bụ nọọsụ ebubo izuru ya bụ nwaọhụrụ n'ụlọọgwụ ha dị n'Okpoko n'ime Ọnịcha.
Akụkọ kọrọ na ya bụ nọọsụ ku ya bụ nwa kwuru n'akụkụ ụzọ, ebe ndị mmadụ malitere inyo ya enyo, na-agba ya ajụjụ ebe nne nwa o ku n'ahụ nọ, ma jụ na ọ gaghị eku nwa ahụ pụọ.
Ha malitere ịmanye ya ka ọ gaa kpọta nne ya bụ nwa tupu ha ahapụ ya.
Mgbe BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed, ọ zara na ya bụ akụkọ ezughị oke.
Ọ sị na a mụrụ ya bụ nwa na-akaghị aka n'ụlọọgwụ ebe nọọọsụ ahụ na-arụ ọrụ bụ Mother of Mercy, n'Okpoko, Ọnịcha, nke mere dọkịnta ụlọọgwụ ahụ ji si nọsụ ahụ na nna ya bụ nwa ha kpọrọ ya gaa tinye ya na "incubator" n'ụlọọgwụ ọzọ.
Mgbe ha na-agazị ebe ahụ ka ndị mmadụ gbakọzịrị bowe ya ebubo a ka ha hụrụ ya ebe o ku nwa a na-ehichabeghi ahụ n'ụzọ.
Harụna sị na ọ bụghị eziokwu na ya bụ nọọsụ zuru nwa ahụ ezu.
Lee ihe nkiri butere okwu a ebe a dịka Linda Ikeji Blog si tinye ya: