Coronavirus in Nigeria: Kedu ihe mere na ndị mmadụ anaghị anwụ n'Afrịka dịka e sibu gba n'ama?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Afrịka aghọọla osisi a tụrụ anya ọdịda nke dị ndụ n'okwu gbasara mkpamkpa coronavirus na-akpa n'ụwa gba gburugburu.

N'ụbọchị iri nke ọnwa Eprel afọ 2020 ka nwunye onye nwe ụlọọrụ Microsoft bụ Melinda Gates kwuru sị na, "etu ozu ndị mmadụ sị dọrọ n'ụzọ na mba Ecuardo etu ahụ ka ọ ga-adị n'Afrịka."

Ọ sịrị na " Ihe mere na ọnụọgụgụ ndị mmadụ bụ Covid-19 n'Afrịka ebughị ibu bụ maka na ha enweghị ihe nnyocha ebe ọ bara ụba."

N'otu aka ahụ, n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Eprel, 2020, ngalaba na-ahụ maka ahụike mba ụwa bụ 'World Health Organisation' kwuru na n'ime ọnwa atọ maọbụ isii na ndị ga-ebute ọrịa coronavirus n'Afrịka ga-erute nde iri.

O ruola otu ọnwa Gate na WHO buru amụma ahụ, ma ọ bụghị ihe ha tụrụ anya ka ha na-ahu.

Kama ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na mba mepere emepe dịka Amerịka, Briten, na ndị ọzọ biaziri karịa nke Afrịka niile kemgbe ọrịa coronavirus bidoro.

Onyeisi ngalaba WHO na-ahụ maka gbatagbata bụ Michel Yao kwuru na nke a nwere ike ọgaghi emezu were kwuo na n'oge ọrịa Ebola, na Afrịka meriri ya bụ ọrịa dịka mmadụ niile mere ihe ha kwesiri ime.

Dịka ọ dị ugbua, na agbanyeghị ọrịa na ọnwụ na-akpọtụ na mba ndị mepere emepe, ndị nwụrụ n'Afrịka erughị ihe ha tụrụ anya.

Ngụkọ WHO nke mpaghara Afrịka wepụtara gosiri na n'abalị iri abụọ nke ọnwa Mee afọ 2020(20/5/2020), mmadụ 90 ebutela ọrịa coronavirus n'Afrịka, ebe mmadụ 2885 bụ ndị nwụọrọla.

Lee ogogo ebeọrịa coronavirus kachasị na mba dị na Yurop na Amerịka taa bụ Mee 20,2020

Lee ihe na-egosi etu coronavirus si kwụrụ na mba ndị mepere emepe na ndị ka na-emepe emepe ọkachasị n'Afrịka

Ọnụọgụgụ ndị a na-egosi na mba ndị mepere emepe nwere ọtụtụ ndị bu ọrịa coronavirus na-agbanyeghị na ha nwere ngalaba ahụike dị mma karịa nke dị na mba ndị na-emepe emepe.

Iji mara ihe dị iche n' egbe na egbe,Dkta Bond Anyaehie na Dkta Ikenna Onoh bụ ndi ọkammụta n'ihe gbasara ahụike ọha kọwara ihe ndị na-etiri Afrịka egwu ha na-agba ka o si gbasa coronavirus.

Ha rụtụrụ aka n'ọtụtụ ihe gụnyere nchekwa ahụ ndị Afrịka nwere, ogwu mgbochi ha nwetaburu, afọ ole ndị nọ n'afrịka gbagara wdg.

Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha kwuru:

1. Ọgwụ mgbochi (Immunization)

Dkta Bond Anyaehie kọwara na otu ihe dịpụrụ iche ha chọpụtara bụ na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus n'ebe ndị agbara ọgwụ mgbochi ọrịa pere mpe ma atụnyere ya n'ebe ndị ọzọ.

Ọ mara atụ were sị na n'Ọwụwa Anyanwụ na ndị bu ya bụ ọrịa pere mpe ma a tụnyere ya ndị bị na mpaghara Ugwu.

Anyaehie chere na nke a nwere ike ịbụ ihe mere ga ndị bi n'Ọwụwa anyanwụ nwee nchekwa ahụ e ji alụso ọrịa ọgụ nke siri ike.

2. Mgbe ọrịa a batara Afrịka

Dkta Ikenna Onoh kọwara na ka ndị mmadụ cheta kwa na ọrịa ka batakwara abata.

Nke mere n'Afrịka ka nọ na mbido ọrịa a zurula ụwa ọnụ.

3. Etu ahụ ndị Afrịka sị alụsọ nje ọgụ ( Immune System)

Anyaehie kọwara na e nwekwara ike ọ bụrụ na ahụ ndị Afrịka nwere ihe eji alụsọ ọrịa ọgụ n'ihi na ahụ ndị Afrịka na-emetụkarị nje nke mere ka ahụ ha gbasie ike karịa nke dị nọ ofesi.

4. Afrịka nwere ndị ntorobia n'uju

Nchọpụta na-egosi na ndị coronavirus na egbukarị bụ ndị gbaliterela n'afọ., ndị dị afọ 60 were gbagowe.

WHO kwuru na ihe karịrị pasent 95 na-anwụ site na coronavirụs bụ ndị karịrrịala afọ 60. Ihe karịrị pasent 50 ndị nwụrụ na Yurop gbara afọ 80.

Na nkọwa ya, Dkta Ikenna Onoh kwuru na ndị mba nọ n'Afrịka kachasị ndị mba mepere emepe nwee ndị ntorobia, ebe mba dịka Amerịka ka mba n'Afrịka nwee ndị okenye.

O kwuru na nke a nwekwara ike ime ka ọnụọgụgụ ndị nwụrụ karịa na mba ndị a.

5. Etu ndị Afrịka ọkachasị Naijirịa si aṅụ ọgwụ

Anyaehie kwukwara na-enwereike, etu ndị Afrịka ọkachasị Naijirịa sị aṅụ ọgwụ nwereike i so n'ihe mere ka ọnụ ọgụgụ ndị bu ọrịa pee mpe. Ọ mara atụ sị na "Onye na-arịa ọrịa na Naijirịa na-agakarị "Chemist" azụta ọgwụ, ọkachasị ugbu a na-ekwu na ọgwụ "Chloroquine" na-enyere aka."

Ọ kọwara nke a nwereike ibute na ọgwụgwụ nwereike ị na-eme n'ụfọdụ ebe mana onweghị onye ma.

6. Ebe ahụ igwe mmadụ na-alụso coronavirus ọgụ (Herd Immunity)

'Herd Immunity' bụ mgbe ọtụtụ mmadụ n'ime igwe nwetarala nchekwa ahụ megide ọrịa na-efe efe.

Ọ bụrụ na ihe ruru pasent 80 n'ime igwe mmadụ ahụ nwere ọdaeshi ime ahụ nke na ọ bụrụ na mmadụ anọ n'ime ise ha zute onye bụ ọrịa ahụ, ọ gaghị enwetali ha.

Anyaehie kwuru na-enwereike ọ bụrụ na ahụ ndị Afrịka esiele ike ma nwee ike imegide ya bụ ọrịa nke nwereike ime na mmadụ ga-ebu ya bụ ọrịa ma ọgaghị ama.

7. Mmadụ ole emerelannyocha

Onoh kwuru na ọtụtụ mba nọ n'Afrịka enweghị ndị na-enye aka achọpụta ndị bu ọrịa coronavirus nke a na-akpọ "Public Health Survelilance".

O kwuru sị "Anyị nwere ike ị na-edufu onwe anyị na-eche na ndị bu ọrịa a pere mpe, mana dịka anyị enweghị ụzọ nchọpụta, nke a nwere ike ị bụ asị".

Bond Anyaehie tinyere ọnụ sị na nsogbụ ọzọ bụ na ndị mmadụ anaghị abịa ka enyocha ha ma ọ bụrụ na ha na-egosi njirimara coronavirus.

O kwuru na ọkachasị njọ na mpaghara ụgwụ ebe o siri ike irute ndị nọ n'ime obodo. Ọ mara atụ sị na n'ebe dịka Kano ebe enwereike inyocha mmadụ otu puku kwa ụbọchị mana enweghị onye na-abịa.

8. Ọnọdụ ihu mbaraigwe Afrịka

A ka na-agbagha na ọnọdụ mbaraigwe e nwere ike imetụta etu coronavirus si ekesa maọbụ na-akpa ike

Otu nchọpụta e mere gosiri na mba ndị ọrịa na-akpa ike site nkesa n'obodo kacha nwe ndị butere ọrịa karia ndị bi mba ọnọdụ ihuigwe ha gbalitere.

Nchọpụta ọzọ lere anya na obodo 100 dị na mba Chaina nwekarịrị mmadụ karịrị 40 butere ọrịa na ebe ọbụla ekpomokụ kacha dị, n'ọrịa ahụ anaghị aba ụba.

Ndị nchọpụta si 'University College London (UCL) na London School of Hygiene and Tropical Medicine n chọpụtara na e nwere ihe ịgba ama na nje coronaviruses na-ekesakarị n'oge winta.

I lee anya Afrịka nwere ọtụtụ mba ekpomokụ na-adịkarị mana ndị ọkammụta ekwubibeghị okwu na nke a so n'ihe mere n'ọrịa anaghị efe maọbụ na egbu nyụghụ nyụghụ ka o si eme na mba ndị ọcha.

Ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus ọ ga-agbago?

Ikenna Onoh kwuru na e nwere ike ọ bụrụ na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus agbagoola ma anyi amaghi n'ihi na ha nwere ike ị na-anwụ ebe dị iche iche.

Ọ kọwara na o nwereike ịgbago n'ihi na ọrịa ka batara Afrịka ma e jiri mba ofesi tulee ya.

Onoh kwuru na oge ọ batara Naijirịa na gọọmentị na-achọ ịchọpụta ndị si ofesi bata(imported cases) na ndị ha na ha nwere mmekọ mana ugbua, ọ banyela n'obodo(community transmission.)

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: