Erosion in Anambra steeti: 'gọọmentị gbatara anyị ọsọ enyemaka'

Mbuze Uruagu
Nkọwa foto, '100 Foot Road' bụ ụzọ dị n'Uruagu Nnewi mbuze na-anyụ anya kemgbe ọtụtụ afọ gara aga.

Ndị ogbe Obelagu/Nkisi Alori streeti dị n' Inland Town Ọnịcha boro aka n'isi ugbua dịka idemmiri na-akpa mkpamkpa n'ogbe ha kemgbe Fraịde.

Dịka onye bi n'ogbe ahụ bụ Nnoso Ezennia kwuru, ya bụ idemmiri eburula ụlọ karịri iri abụọ (22) nke gụnyere ụlọakwụkwọ, ụlọụka na ebe obibi ndi mmadụ, ma chụọ ihe ruru otu puku mmadụ na narị ise na be ha.

Ọ sị na ya bụ idemmiri malitere na ọwammiri nke gọọmenti na-arụchaghị n'ogbe ahụ kemgbe afọ atọ gara aga.

Nonso sị na ya bụ idemmiri ka ga-aga n'ihu n'imebi ihe n'ogbe ahụ ma ọ bụrụ na gọọmenti etinyeghị anya na ya ngwa ngwa.

Ọ sị na ndị bi n'ogbe ahụ na-achị obi n'aka oge ọbụla mmiri zoro maka na nke ha na-arịa ugbua bụ nke zoro na Frịade.

Ọ kọwara na ụbọchị Satọde gara aga ka ndị ogbe ahụ na ndị ụka na ndị NGO mere ngagharịiwe iji kpọbata uche gọọmenti n'ebe ahụ.

Ọ sị na ọtụtụ ndi bi ebe ahụ a gbapụchawala maka egwu nke nwereike ịme echi.

Nonso sị na ndị otu "landlord" ogbe ahụ atụkọtala ego ruru nde Naịra abụọ na ụma, mana ya bụ ụkwara abụghị nke akwụ na-egbo.

Ndị ogbe ahụ na-akpọkụ gọomenti etiti na nke Anambra steeti ka ha do do do gbatara ha ọsọ enyemaka tupu ya bụ mmiri ama ehi n'anya.

Akụkọ ga-amasị gị