Ngozi Okonjo-Iweala: Ala Igbo nwere ihe niile n'iji kwalite akụnụba Naịjirịa

    • Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dọkta Ngozi Okonjo-Iweala nwere mkparịta ụka pụrụiche na BBC Igbo a kpọrọ "Kwuo Uche Gi".

Na mkparịtaụka a, Okonjo Iweala kwuru na ya kwụwara aka ya ọtọ oge ọ rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta Ego nke Naịjirịa n'oge Olusegun Obasanjo nakwa Goodluck jonathan chịrị ọchịchị.

Gee ọkpụrụkpụ okwu Dkt Ngozi Okonjo-Iweala kwuru ebe a:

O kwuru sị: "Nne m na nna m nyere m ọzụzụ dịka ndị Igbo. Ha gwara m ka m were ụbụrụ m wee chepụta ezigbo echiche kama iwere ihe onye ọzọ."

"Edebere m aka m ọcha. Obi m dịkwa ọcha."

Gee mkparịtaụka ahụ n'uju:

Oge anyị jụrụ ya maka akụkọ kwuru na gọọmenti Abia steeti kpọrọ ya ka ọ bịa nyere ha aka ịdozi akụnaụba ha, Okonjo-Iweala kwuru na nke ahụ abụchaghị eziokwu.

Ọ kọwara na ya gụtara ya bụ akụkọ na 'newspaper' mana ya ahụbeghị akwụkwọ ozi si n'aka gọọmentị Abia.

O kwekwara nkwa ya ga-enye nkwado ma a kpọọ ya ụdị oku ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na obi dị ya ụtọ na ọ bụ ya bụ nwaanyị mbụ bụ minista okwu ego dị n'aka na Naịjirịa, nke megheere ụmụnwaanyị ndị ọzọ ụzọ kemgbe ahụ.

N'ajụjụ maka etu mba Afrịka ga-esi pụta na ọgbatauhie sọ coronavirus, Okonjo-Iweala kwuru na gọọmentị ndị mba Afrịka kwesịrị ibu ụzọ lebaa anya n'ihe ha ga-eji kwalite akụnụba ha n'oge a.

O rịọkwara ka gọọmenti nye ndị mmadụ ihe oriri, ego na ihe ndị ọzọ eji enyere ndụ aka n'ihi na ọrịa a egbochiela onye ọbụla ịga ọrụ.

O kwuru na "ọ bụrụ na ị ga-asị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ, na ị kwesiri ịnye ha ihe ga-eji nọrọ n'ụlọ."Okonjo-Iweala kwukwara na ihe o ji dị oke njọ n'Afrịka bụ na "tupu coronavirus abịa, Afrịka nwere oke nsogbu n'akụnaụba ha."

Kama ọ rịọkwara ka ndị mmadụ gee ntị na usoro ndị ọrụ ahụike wepụtara maka ịgbochi ya bụ ọrịa dịka ịkwọ aka, ikpuchi imi na ịgbalahụ ebe ọtụtụ mmadụ nọ.

Ọ sị na ya bụ ọrịa adịghirị onye ọbụla mfe.

Ọchịchị Naịjirịa

Mgbe ajụrụ ya ma onwere uche n'ọchịchị Naịjirịa, Okonjo-Iweala zara na ya efeela ala Naịjirịa oge ya na Obasanjo nakwa Jonathan rụrụ.

O kwuru sị: "Ugbua, ọrụ m na-arụ bụ nke Afrịka na nke mba ụwa. Ọrụ a dị m ụtọ n'obi nke ọma."

Okonjo-Iweala kwere nkwa ịhụ na ndị Igbo nwetere oke ruru ha ma na-arịọkwa gọọmenti ala Igbo ka ha gbaa mbọ hụ na ego nke ha nwere n'ụlọ banyere n'ihe ga-enyere ọha na eze aka dịka ezigbo ụzọ, ọkụ na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.

Ọ sị na ọbụrụ na ndị ọchịchị ala Igbo kwụwa aka ha ọtọ na ihe gbasara ego dị n'ụlọ na ọ ga-adị nfe iwebata ego ọzọ n'ụlọ.