You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Priscilla Ekwueme Eleje: Onye bụ nwaanyị a na-akpa ike?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Priscilla Ekwueme Eleje bụ nwaanyị mbụ mbinyeaka ya na-apụta n'ego Naịjirịa nke otu puku, n'ime afọ iri isii na otu.
Ọ bụkwa nwaanyị nke mbụ ga-anọ n'ọkwa "Director of Currency Operations" n'ụlọakụ etiti na Naịjirịa.
Ihe abụọ ndị a bụ ihe mere o ji ewu ewu ebe niile na Naịjiria gụnyere soshal midia.
Lee ihe ndị anyị chọpụtara maka ya.
Ọ bụ onyeisi na-ahụ maka ngagharị ego na Central Bank bụ ụlọakụ etiti Naịjirịa.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum nke Jos dị na Plateau steeti n'afọ 1981 na afọ 1984.
- O bidoro ọrụ n'ụlọakụ etiti n'afọ 1984 rue afọ 2010 mgbe ọkwa ya rịrị elu.
- Ọ gụkwara akwụkwọ na mahadum Boston dị na Massachusetts dị na mba Amerịka.
Priscillia ga-esonye Ngozi Okonjo Iweala na Sandie Okoro bụ ụmụnwaanyị Naịjirịa abụọ nwere ọkwa n'ụlọakụ ukwu nke ụwa niile.
Anyị ga-ewetakwa ihe ndị a na-amaghị maka Odoziakụ Priscillia Ekwueme Eleje.