You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Sandie Okoro: Ihe ị kwesiri ịma maka agbara nwaanyị a
Kemgbe ụnyaahụ bụ Wenezde, aha Sandie Okoro, ada Igbo na-arụ dịka osote onyeisioche na-ewu na soshal midia dịka ụfọdụ ụmụ Igbo ji ya eme ọnụ.
Mana ọ bụ taa ka nwata ahụ wara eze, ọ b ụ n'afọ 2016 ka ụlọakụ ụwa a kpọrọ "World Bank" na Bekee mere Sandie Okoro osote onyeisioche n'ụlọọrụ ha n'ihe gbasara ikpe(Senior Vice President & World Bank Group General Counsel.)
Sandra Okoro bụ onye ọkaiwu mba Briten na-arụ ọrụ na ụlọakụ HSBC tupu ụlọakụ ụwaniile a họpụta ya dịka osote onye ndu ha.
Otu a na-echeta ya dịka otu agbara nwaanyị ndị Igbo
Ebe Anny na-ekwu maka Sandie na ụmụ nwaanyị ndị Igbo ọzọ welitere isi
Dika a na-ajụ ase gbasara ya, lee ihe isii ịkwesiri ịma maka Sandra Okoro.
1. A mụrụ ya n'ala Bekee - n'obodo Fulham dị na mba Briten
2. Nna Sandra bụ onye Igbo ma bụrụkwa onye nkuzi mana Nne ya abụghị onye Igbo.
3. Ihe gbasara oke ruru ụmụ nwaanyị bụ ihe dị ya oke mkpa.
4. O ritela ụfọdụ ntụrụgo gụnyere nke Middle Temple UK, FTSE Board n'afọ 2016 nakwa Power List nke mba UK.
5. O sonyela n'ọsọ 'London Marathon ugboro abụọ.
6. Ọ na-enye oge ya n'efu n'ịkwado ihe gbasara ụmụakwụkwọ ụmụnwaayị.
Ụmụ nwaanyị Igbo ndị ọzọ rụrụ ọrụ na World Bank
Obiageli Ezekwesili -
- Ngozi Okonjo-Iweala (NOI) - Ọ rụrụ ọrụ afọ 25 n'ụlọakụ ụwa niile tupu o rue ọkwa onye abụọ n'ụlọọrụ ahụ.
- Arunma Oteh - E mere osote onyeisi n'ụlọakụ ụwa niile n'afọ 2015 mana ọ hapụla ya bụ ọkwa ugbua.