You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Okonjo-Iweala abụrụla otu n'ime ndị ndụmọdụ na Twitter
Ụlọọrụ sochal midia na-ewu ewu bu Twitter emela onye bụbu minista na-ahụ maka ego na akụnaụba na Naịjirịa bụ Ngozi Okonjo-iweala onye ọrụ ha.
Okonjo-Iweala ga-arụ ọrụ dịka otu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na "Board" ndị Twitter.
Okonjo-Iweala ruburu ọrụ na ọchịchị Olusegun Obasanjo site afọ 2003 ruo 2006 na Goodluck Jonathan site 2011 ruo 2015.
"Anyị na-agba mbọ ịhụ n'ụwa anyị dị mma , Twitter nyere ohere ịgbasa ozi ma mee ka mkparita uka mmadụ na ibe ya maka ihe na-eme n'ụwa mụbawanye," bu ihe Okonjo-Iweala kwuru na ozi ozipuru.
Okonjo Iweal bụ onye a na-ukwanyere ugwu maka ọru ọ na-arụ na World Bank.
O dere akwụkwọ na nso a maka ihe ọ hụru n'ọchịchị Jonathan.
A ha akwụkwọ a bụ "Fighting Corruption is Dangerous: The Story Behind The Headlines".
Twitter nwere mmadụ nde 336 na-apị akara ha kwa ọnwa.
N'Afrịka, ndị mmadụ kwadoro Twitter, bu ihe ha ji akparịta ụka banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ.
Okonjo-Iweala jikwa Twitter nabata ọkwa ọhụrụ a:
Ma kelekwa onye ọrụ a Twitter zipuru ozi a na mbụ.
Nke a bụ ugo ọzọ Okonjo-Iweala ga-etinye na ndị nke onweburu.