Nnamdi Kanu: Akụkọ ụgha na ọ nwụọla echetarala ndị mmadụ ihe ọ na-ekwu maka Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Soshal Midia Naịjirịa na-akpọtụ akpọtụ kemgbe abalị Tuzde dịka otu nwaanyị na-asị na ya bụ onye ntaakụkọ ama ama bụ Kemi Olunloyo kwuru n'ụdị o si ekwu maka ndụ Nnamdị Kanu.

Olunloyo dere n'akara Twitter ya na ya agaghị ekwunwu ma onyeisi ndị otu na-achọ ikewa Naijrịa ma nwete mba Bịafra akpọrọ "Indigenous Peoples of Biafra" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ọ dị ndụ.

Ọ gara n'ihu tụọ aka na onwereike coronavirus ataala isi Maazị Kanu, nke mere ka ndị otu ya kpọta onye ọzọ ga-anọchịte anya ya.

Olunloyo dere si "echi, a ga m agwa ụnụ ma onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ma ọ nwụọla ka e nwere onye si mba Sudan na-anọchite ya dika ọ nwụrụla"

O dere nke a dika o wepụrụ nke mbụ o dere dika ndị na-akwado Nnamdi Kanu jị ịbụ ọnụ sosie ya n'ike.

Okwu a na-echetara ndị mmadu okwu Kanu na ndị otu ya na-ekwukarị maka onyeisiala Naijịria bụ Muhammadu Buhari.

N'agbanyeghị na ihe niile ọ na-ekwu maka ọnwụ Buhari enweghi isi nke o ji enwe ọdụ, Kanu na ndị otu ya na-ekwusi ya ike sị na onyeisiala Naịjirịa anwụọla ma sịkwa na ọ bu otu nwoke aha ya bụ Jubril si mba Sudan na-anochite anya ya ugbu a.

BBC Igbo nyochara okwu a Kanu na ndị otu ya na-ekwu maka Buhari, ma kpọọ ya ihe ọ bụ - okpotokpo asị.

Gụọ maka nyocha anyị mere ebe a: Ugboro ise akụkọ ụgha kpọtụrụ n'Ala Igbo.

Ọ na-ada na ntị ka Olunloyo ọ chọrọ ịgbanyetu Kanu ọgwụ ya ka ọ hụta etu o si atọ.

Nke a mere ka ụfọdu ndị mmadu na-asị na Nnamdi Kanu ga-eme ihe onyonyo were gosi ndị ụwa na ọ ka dị ndụ.

Ma gosikwa ihe igba ama ndị mmadụ ga-eji mara na ọ bụ ya n'ezie.

N'aka nke ọzọ ka ụfodụ ndị mmadụ na-ewesị Olunloyo iwe maka ihe o kwuru.

N'isi ụtụtụ ụbọchị wenezde ka Olunloyo tụgharịrị were depụta n'akara twitter ya na Nnamdi Kanu ka dị ndụ.

Ọ sị: "Nyocha m mere n'abalị gosiri na Nnamdi Kanu ka dị ndu, o nweghi mgbe o jiri gaa mba Italị maọbụ nọrọ n'ụlọọgwụ. Mụ na nwanne m bụ Femi Fani-Kayode akpaala o were gwa m na kanu anwubeghị na ha abụọ akparitala ụka."

BBC Igbo kpọtụrụ otu onye ya na Nnamdi Kanu na-adị na mma ịmata ebumnuche ya maka okwu a mana ọ sị na ọ bụ na mgbede ka onyeisi Ipob ga-ekwu okwu banyere ya.

N'agbanyeghi nke a, nchọpụta BBC bụ na Maazị Kanu ka nọ n'ala mmadụ, dịka ọ ka kwuchara okwu n'ụbọchị Satọde gara aga.

Ọzọ bụkwa na ya bụ nwaanyị na-ekwu okwu bụ onye na-agbakarị egbe ọnụ na Twitter site n'ịsị nke a na nke ọzọ anaghị ahụta isi na ọdụ ya.

Agwa ikwu okwu na-efegharị sọsọ n'ikuku bụkwa ihe ọtụtụ mmadụ jiri mara Maazị Kanu na otu Ipob ya.

Ihe isii Nnamdi Kanukwuru gosiri na Buhari bụ Jubril nwa Sudan

  • Nke mbụ bụ na ọ sị na Buhari nke banyere ọchịchị n'afọ 2015 dịka onye gbagoro afọ iri asaa na ise mana Buhari nọ ugbua dịka onye dị afọ iri na ise ma gbasie ike, nti ha abuọ abụghị otu
  • Nke abụọ o kwuru bụ na Buhari nke mbụ enweghị ọtụtụ ntutu mana nke nọ ụgba nwere ụbara ntutu
  • Ọ sị na Buhari nke mbụ na-asụli asụsụ Fulani akpọrọ Fulfude mana nke nọ ugbua anaghị asụli ya
  • O kwukwara na Buhari nọ ugbua anaghị anọketekarị nwunye ya maọbụ ndị ezinaụlọ ya
  • Ọ gakwara n'ihu kwuo na Buhari nke mbụ toro ogologo karịa nke nọ ugbua
  • Ihe ọzọ Maazị Kanu gbadoro ụkwụ bụ isi na Buhari nọ ugbua anaghị a ga-akarị ụlọọgwụ dị na mba London dịka onye na-aya ezigbo ahụ si kwesi ị na-aga.

Mana nchọpụta BBC bụ na okwu Kanu a niile bụ ihe avọpụtara n'ikuku makana onye nọ n'Aso Rock ma na-achị Naịjirịa bụ Buhari nke be nna ya bụ Daura dị na steeti Katsina.