Jubril of Sudan: 'M ga-aṅụ iyi na ọ bụ Buhari nọ n'Aso rock'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị ọnụ na-eru n'okwu, asaala Nnamdi Kanu maka ihe isii o kwuru gosiri na ọ bụghị Buhari nọ n'ụlọ onyeisiala.

Minista na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ bụ Chris Ngige, ṅụrụ iyi na ọ bụ Muhammadu Buhari nọ n'oche onyeisiala.

O kwuru na ọ bụ dibia Bekee nyere onyeisiala Buhari ọgwụgwọ puruiche ahụ ya nabatara ọfụma.

Ngige kwuru nke a mgbe ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ n'okpuru ọchịchị Idemmili dị n'Anambara steeti.

Ndi ntorobia otu Ugwu a kpọrọ "Arewa Youth Consultative Forum (AYCF)" kwuru na Kanu bụ onye na-aṅụ ọgwụ ike ndị mmadụ ekwesịghị ige ntị.‏

Ihe ndị ọzọ na-ekwu na soshal

@JohnPau2395667 kwuru na kama ịkatọ Kanu, na ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ mee nyocha gbasara ihe ndị o kwuru.

@UcheOssai10 kwuru na ọ dị mma ka onyeisiala gosikwa Kanu n'ụzọ sayensi, na ọ bụ Buhari n'ezie na ọ bụghị Jubril nke Sudan.

@topluv1234 kwuru na Kanu amaghị ihe ọ na-eme makana ọ ga-atụnyere Buhari ọzọ.

@solanougwu33 kwuru na ebe ọ bụ na Ngige na-ekwu na ọ bụ Dọkinta mere ka Buhari gbanwe n'anụ ahụ, na ya na-ele anya ka ọ hụ ka Ngige ga-esi mee nke ya ma ọ gbagote n'afọ.

Ihe isii Nnamdi Kanu kwuru iji gosi na Buhari bụ Jubril nke Sudan

  • Nke mbụ, Buhari nke banyere ọchịchị n'afọ 2015 dịka onye gbagoro afọ iri asaa na ise mana Buhari nọ ugbua dịka onye dị afọ iri na ise ma gbasie ike, nti ha abuọ abụghị otu.
  • Nke abụọ,na Buhari nke mbụ enweghị ọtụtụ ntutu mana nke nọ ụgba nwere ụbara ntutu.
  • Buhari nke mbụ na-asụli asụsụ Fulani akpọrọ Fulfude mana nke nọ ugbua anaghị asụli ya
  • O kwuru na Buhari nọ ugbua anaghị anọketekarị nwunye ya maọbụ ndị ezinaụlọ ya.
  • Buhari nke mbụ toro ogologo karịa nke nọ ugbua
  • Buhari nọ ugbua anaghị a ga-akarị ụlọọgwụ dị na mba London dịka onye na-aya ezigbo ahụ si kwesi ị na-aga.

Cheta na Buhari gwara ụmụ Naịjirịa nọ na Poland mgbe ọ gara ọgbakọ, na ọ bụghị onye a rụrụ arụ "clone", kama na ọ bụ Buhari n'ezie.

Etu ọ dị ugbua, ụlọọrụ onyeisiala ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu ọhụrụ Kanu kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: