Ash Wednesday: Lee ka ụkantụ si aga

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụkantụ n'Adamawa

Ụkantụ n'Adamawa
Nkọwa foto, Onye buru ntụ n'Adamawa

Taa bụ ụkantụ ndị ụka Kraịst n'ụwa niile.

Ndị otu Kraịst na-egbu ntụ n'ihe iji chetere onwe ha na mmadụ bụ aja, mmadụ ga-alọhachị n'aja.

Ndị ụka katọlik na Naịjirịa jikwa ohere a egosi iwe ha maka oke ogbugbu ndị mmadụ nakwa enweghị ezi nchekwa na Naịjirịa.

N'Adamawa, ndị ụka zakwara aha ha gosị na ha so n'ihe a na-eme.

Na Legọsi, ndị ụka gosiri onwe ha tupu ha agawa ụlọọrụ.

Ụkantụ ndị otu Kraịst
Aha onyonyo, Ash Wednesday: 'Onye ọbụla chọrọ gị okwu maka uwe ojii i yi, gwa anyị'- Bishop Martins

N'Enugwu, ndị ụka Katọlik mere ngagharị ekpere ka a kachara ụka ntụ.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ndi ụka katọlịk nyekwara ntuzịaka ka onye ọbụla yiri ụweojii maọbụ kere akwa ojiri n'aka.

Ụkantụ

Mana na ụka ha dị na Falomo, Legọs, ọ bụghị mmadụ niile yi ya bụ akwa ojii dịka ụka siri kwuo.

Ụkantụ

Ọtụtụ ndị eyighị ya bụ akwa ojii sị na ha kwadoro maka ị ga ọrụ.

Ụkantụ

Agbanyeghị, ọtụtụ yikwa akwa ojii.

Ụkantụ

Ọtụtụ mmadụ juputara n'ụka Church of Assumption dị na Falomo, Legọs.

Ụkantụ
Ụkantụ

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: E ji m asambodo mahadum m mana a na ma-azụ ezi'