New Year 2023: I nwere mkpebi maka afọ ọhụrụ a? Lee ụzọ ise ị ga-esi mezuo ya

Afọ 2023 amalitela, anyị anabatala afọ ọhụrụ.

Ọtụtụ n'ime anyị na-ahụ oge a dịka mgbe ha ji eme mkpebi ime ihe ga-abara ha uru.

O nwereike ịbụ ichuso ezigbo ahụike, ihazi ego gị, imụta aka ọrụ ọhụrụ maọbụ ịkwụsị ụfọdụ agwa kpam kpam.

Otu ihe kacha dị ezigbo mkpa na mkpebi ọbụla i mere bụ nkwalite mmụọ mana mụ na gị ma na ọ naghị adịcha fecha fecha.

Naanị mmadụ ruru pasentị asatọ na-emezu nkwa ha kwere onwe ha n'afọ ọhụrụ dịka otu nchọpụta e mere na Mahadum Scanton nke Statistic Brain wepụtara.

O kwesịghị ịbụ gị.

Lee ụzọ ise ị ga-esi gbanahụ akwụdoghị na mkpebi i mere n'afọ ọhụrụ. Ya gaziere gị!

1. Bido obere obere

I bido na nke nke, ị nwereike igbago n'ogo dị elu.

Ụfọdụ na-eche na a ga-eji 'abracadabra' wee nwete ihe ha na-achọ dịka Rachel Weinstein bụ ọkammụta n'ihe gbasara etu mmadụ si akpa agwa si depụta.

Iji maa atụ, malitegodu na-agba ọsọ ọha a kpọrọ 'marathon' site n'igorogodu akpụkpọụkwụ ị ga-eji na-agbachara ọsọ n'ime ụlọ gị.

Ị chọrọ ịbụ ọkachamara n'isi nri, ọ ga-adị mma isoro onye ma anya ya ọfụma na-emechara ya tupu i nwee ike ịkwụdo ọfụma.

Makana n'ezie n'ezie mgbanwe na-abịa na nke nke dịka Weinstein si kwuo.

2.Kpọọ okwu aha

Anyị na-enwekarị ihe anyị chọrọ ime n'obi mana anyị enweghị eserese etu anyị ga-esi mezu ya.

Ọ dịmkpa ime nke a.

Iji maa atụ, kama isi m ga-anagakarị ụlọ mgbati ahụ n'afọ, ọ ga-adị mma ka ikwu ụbọchị ndị ị ga-anaga ya bụ ebe n'ime izụ ụka.

Nke a ga-eme ka mkpebi gị bụrụ ihe mmezu kama ị bụ naanị ihe okwu ọnụ dịka ọkammụta Neil Levy nke mahadum Oxford si depụta.

3. Chọọ ndị gị na ha ga-ejikọ aka

Ịchọta ndị gị na ha ga-agakọ njem imezu ebum no obi gị gbasara afọ ọhụrụ a na-agbakwa ume.

Nke a gunyere na ịchọta ọyị gị, gị na ya ga na-agakọ ọmụmụ gbasara ihe ahụ ịchọrọ ịmụta maọbụ ikwupute mkpebi gị ka ọha nụrụ ya.

Dr John Michael na-akuzi na mahadum Warwick ekwuola na inweta nkwado n'aka ndị ọzọ ga-enye aka ime ka ịnweta ihe na-achọ ọsịsọ.

4. Merie Ikpụ afọ n'ala

Ihe sie ike, gba nkiti ma nyochakwa ọnọdụ ọzọ ọfụma.

Kedụ ihe mgbochi ị gabigara?Kedụ ụzọ kacha dịmma is igboo ya?Kedụ nke na-adabaghị.

Gwa onwe gị eziokwu ma ṅụrịa ma onwe nke ịmetere ọfụma.

Iji ma atụ, ọ bụrụ na ịxchọrọ ị na-eri ezigbo nri , kama iri achịcha ọcha, rie nri esi n'Oka wee mepụta.

I nwekwara ike hapụ iri ihe ntacharị ọnụ na-ebute ibu ma na-eri ihe ntacharị ọnụ eji mkpuru osi na-edozi ahụ.

5.Kwe ka mkpebi gị na ihe ga-eme n'ọdịnihu

Mkpebi kachasịnụ bụ nke ya ị na ebum n'obi gị n'ọdịnihu na-agakọ karịa ma ina-etigharị dịka ọkammụta na agwa mmadụ bụ Dr Anne Swinbourne si kwu.

Ọ bụrụ na igosi beghị mmasị gbasara egwuregwu, ọ baghị uru ịrọwa nrọ ị bụ ọkaibe na ya.

Naanị mkpebi siri ike ezughị ime ka o mezuo, ị ga-eji eserese ị ga-eji me ka ọ bịa na mmezu.

Ụjọ atụkwalagị ị nweta nkwado maọbụrụ na ọhịawara gị ahụ imezu nkwa ịkwere onwe gị n'afọ ọhụrụ a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị