Nigeria Visa: Uru na ọghọm dị n'inye ndị Afrịka 'visa' n'ọnụ ama Naijiria

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwupụtara na nso nso na Naịjirịa, site n'afọ 2020 gawa ga-enye ndị Afrịka na-abata akwụkwọ njem (Visa) n'ọnụ ama Naịjirịa.

Amụma a nke sitere n'atụmatụ 'Africa Free Trade Agreement' nke birila ọkụ, ọ ga-eme ka njem n'etiti mba ndị Afrịka ọzọ na Naịjirịa dị mfe.

Cheta na Naịjirịa binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta n'ọnwa Julaị afọ 2019.

Raphael James bụ onyeisi ụlọọrụ na-eme nchọpụta na nhazi ozi a kpọrọ, "Center for Research, Information Management and Media Development (CRIMMD)' na bekee kwuru na o nweghị ihe dị n'isi azu.

Na nkọwa ya,"Na mbụ mmadụ nwere ike ịbata maọbụ hapụ Naịjirịa na-ejighi akwụkwọ ọbụla."

"Ndị a ha na-agwa bịa kwụwa ụgwọ 'visa' na-abatabu na-ejighi akwụkwọ ọbụla."

"Mmadụ na-enubata Naijiria n'igwe mbụ, naanị ndị nwere agba ka ọ na-ara ahụ inweta akwụkwọ eji abata ala Naijiria."

Uru dị n'atụmatụ a?

Ndị na-ahụ ihe gbasara akụnaụba nakwa mmekọrịta mba na mba dịka Boniface Chizea,Richard Mammah na Raphael James kwuru na uru dị na ya gụnyere:

  • Ọ ga-emeda ndị Afrịka ndị ọzọ obi dịka ụfọdụ na-ewe iwe maka Naịjirịa gbachiri ụzọ e si abata n'ala ha.
  • Ọ ga-enyere mmekọrịta mba na mba n'Afrịka aka
  • ka ndị mba ọzọ were anya ndị Afrịka ndị ọzọ ga na-enweta akwụkwọ njem na-egbughi oge ọbụla.
  • Naịjirịa ga na-enweta ego site n'inye ndị Afrịka ndị ọzọ chọrọ akwụkwọ njem.

James si, "Mba Kenya na-anata dọla iri ise ($50) iji nye mmadụ visa dịka ha na-azọchi n'ama."

"Nke a na-aba n'akpa gọọmenti ozugbo ozugbo."

Ọghọm dị na ya?

Ndị ihe a na-ekwu doro anya kwuru na ọghọm dị n'atụmatụ ahụ karịrị uru dị ya.

  • Enweghị ọrụ

Ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba bụ Boniface Chizea kwuru na "Naịjirịa buru ibu mana akụnaụba Naịjirịa anaghị eto eto ugbua."

"Enweghị ọrụ ka bụ nnukwu nsogbu."

  • Nsogbu nchekwa

Chizea gbara ama na nsogbu nchekwa chere Naịjirịa aka mgba ga-akawanye njọ ma e bido imezu atụmatụ ọhụrụ gọọmentị gbasara inye ohere ka ndụ Afrịka ọbụla bịawa Naịjirịa.

"Ohi, ntọ, na mpụ bụzi ụzọ e si akpata ego, ị na-akwadokwa ịkpọbata ndị ọzọ ga-abịa chọkwa ọrụ."

  • Nrụrụaka

Ha kwuru na nrụrụaka agaghị enye ohere ka Naịjirịa nwete ego site n'inye ndị mmadụ akwụkwọ njem n'ihi nrụrụaka.

Akụkọ ga-amasị gị: