Maersk MD: Gịnị ka i kwesiri ịma tupu ị nabata onye odibo

Onye bụ onye ahụ ị chọrọ ka ọ bụrụ onye enyemaaka n'ulọ gị?

Akụkọ dị iche iche na-apụta n'oge gara aga na-egosi etu ndị enyemaaka na-atọ ụmụaka maọbụ gbuo ndị 'ọga' ha.

Nke fotere chi taa bụ ụbọchị iri ọnwa Disemba, 2019 bụ akụkọ etu onye ọrụ ọkụ latrịk na-arụrụ onyeisi ụlọọrụ Maersk si gbuo nwunye ya ma merụọ 'ọga' ya ahụ.

Ndị uweojii nọ na Legọsị kwuru na ha anwụchiela mmadụ abụọ a na-eche kpara mkpa a.

Nke a abụghị nke mbụ a na-anụ udiri akụkọ a na Naịjirịa mana gee ntị ka ị mata ụfọdụ ihe ga-enyere gị aka ịgbanahụ ọnwụnwa ndi odibo na-ebute.

Ihe niile di mkpa ma ị na-achọ onyeenymemaaka

BBC Igbo gbara otu nwaanyị aha ya bụ Joke Afolabi bụ onyeisi ụlọọrụ na-ezipu ndị ọrụ enyemaaka a kpọrọ 'Conciege and Home Care Services' ajụjụ ọnụ gbasara okwu a.

Afolabi kwuru na ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ ha na-ezipu ndị mmadụ dịka ndị enyemaaka gawa ụlọ dị iche iche mana ha na-agba mbọ hụụ na ndị niile ha tinyere n'ọrụ bụ ndị mara ihe a chọrọ n'ụwa.

Onye ọzọ aha ya bụ Christanah Akindolie bụ onye ọrụ ndụmọdụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ dị ezigbo mkpa ka ị bụrụ onye na-edo anya, onye nwere ọchịchọ ịmata ihe niile.

Ajuju asaa ịkwesiri ịgba onye ọbụla chọrọ ịbụ onye enyemaaka gị

1. Gịnị mere i ji hapụ ebe ị na-arụ n'oge mbu?

Dịka ọ na-eme nkọwa a, lee anya ka ị mara n'okwu ya ọ na-adaba.

2. Ebe ka i si bịa? Onye bụ nne na nna gị? Ezinaụlọ gị?

3. Nata ya aha na akara ekwenti onye ọ rụrụ ọrụ n'aka ya tupu ọ bịa na nke gị.

4. Lee uda olu ya nakwa omume ya mgbe ọ na-asa gị okwu.

5. Nye ndị uweojii aha ya, ka ha nyocha ọfụma mara ma ọ bụ onye nupuru isi n'iwu, maọbụ onye ha na-achọ achọ.

6. Kpọrọ ya gaa ụlọọgwụ ka ha nyocha ya, ka ha mara ma ọ dị ime, maọbụ o nwere ọrịa mmịnwụ(HIV), ịba ojii (hepatitis) nakwa ụkwaranta (tuberculosis.)

Ha nyochakwa ụdi ọbara dị ya na-ahụ(blood group) maka adịghị a ma ama.

7. Lebanye anya na ndị kwudoru ya dịka onye akaebe.

Akụkọ ga-amasị gị