You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Norwich City vs Arsenal: Emery alaala mana ihe ji Arsenal ka jisi ha ike
O rubeghi abalị abụọ kemgbe ndị isi Arsenal chụrụ onye nkuzi ha bụ Unai Emery mana ha ka jikwa ka ha ji.
Nke a pụtara ihe taa dịka ha na otu Norwich City gbara onwe ha onye laba onye laba mgbe ha zutere.
Pukki nke Norwich City pịawara goolu mbụ na nkeji 21 nke Aubameyang nke Arsenal sara ya na nkeji 29.
Cantwell nyekwara goolu ọzọ na nkeji 45+2 nke pụtara na Norwich city nọ Arsenal n'ihu na ngwụcha agba nke mbụ.
Aubameyang gbara penariti nke onye nche otu Norwich chetara na mbido agba nke abụọ.
Ogbu opi kwukwara ka agbagharia ya bụ penarịti nke ghọrọla goolu nke abụo nyere ndị Arsenal.
Arsenal nwara ike ha ị meri ya bụ asọmpị mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
Ha ga-ezute otu Brighton n'ụbọchị Tọzde ebe Norwich City ga-ezute otu Southampton.