Bini Bronze Cockerel: Ụfọdụ ihe ndị ọcha zuru na Naịjirịa mgbe gboo

Ebe foto si, PA Media
Mahadum Cambridge dị na mba Briten ga-ewelata ọkụkọ eji ọra na achara mee ndị be ha buru n'obodo Bini n'oge gboo.
Mahadum 'Jesus College' dị na Cambridge sị na ha na-eme nke a site na mkpesa otu nwata akwụkwọ mere banyere nka a ọ sị bụ "ihe ezutere n'ohi".
Mahadum a kwuru na akwukwọ mgbasaozi sị: "Onweghi mgbagha na ọ bụ n'Obi Eze na Bini ka e si zute nka a n'afọ 1897. E nyere mahadum a nka a n'afọ 1905."
Mahadum a kpebiri, site na nkata ya na ndị na-ekwuru Bini okwu, na ọ bụ Eze Bini nwe ya bụ nka.
Nka so n'ime ọtụtụ nka a na-eche na ndị ọcha zuru n'ohi mgbe gboo.
Lee ụfọdụ n'ime ha:

1) Eze Nwaanyị Idia:
Ọ bụ mpụ enyi na ọra nchara ka eji mee nka a zikoro nne Eze Bini. Ọ bụ ihe dị ka afọ 16000 ka emepụtara ya.
Ọ bụ ebe a na-edowe ihe nkiri na mba Briten akpọrọ "British Museum" ka edowere nka.

Ebe foto si, Getty Images
2) Ife bronze head:
Ọ bụ n'afọ 1938 ka eguputara nka a n'obodo Ife.
A na-ache na nka bụ isi Eze. A na-eche na ọ bụ n'afọ 1300 ka emepụtara ihe a.

Ebe foto si, Getty Images
3) Nok Terracota:
Ọ bụ na mpaghara Katsina Ala dị na Benue steeti ugbua ka egwuputara nka Nok ndị a .
Ụfọdụ n'ime ha ka dị na Naịjirịa mama ọtụtụ nọ na mba ofesi.

Ebe foto si, British Museum
Ndị ọzọ ndị ọcha sị na ha na-eweghatịte
Onwekwara ụfọ nka nke ndị ọcha sị na ha ga-eweghachite Naịjirịa dịka nke dị na ọba nka mba Briten na otu "Bening Dialogue Group" nwere nkwekọrịta na a ga-ewechite.
Nke a metụtara nka ndị a agha Briten zuru mgbe ha busachara ndị Bini agha mgbe gboo.
Naịjirịa no njem ịnata nka ndị kemgbe enwetere nwere onwe n'afọ 1960.
Nka ndị a ruru otu puku.
N'afọ 2014 ọba nka Bekee kpọrọ "Museum of Fine Arts" dị na mba Amerịka weghachitere nka asato a na-ache na-ezuru mgbe gboo.

Ebe foto si, AFP
Ndị so n'otu "Benin Dialogu Group"
Ndị si ngalaba na-ahụ maka nke na Naijirịa bụ nke akpọrọ "National Commission of Museum and Monuments", ndi na-anọchite anya ọba nka dị iche iche na Yurope, Obi Eze na Bini, gọọmenti Edo steeti so n'ime otu a na-aga njem iwelata nka ndị a.
Nkwekọrịta nke ha nwetere ga-ahụ na ụfọdụ n'ime nka ndị a laghachitere ebe ha si.

Ihe nkiri ga-amasị gị










