Nwa Ben Enwonwu: Anyị agaghị eketa n'ime ego 'Tutu'

Ebe foto si, Oliver Enwonwu
Ọkpara Ben Enwonwu bụ Oliver Enwonwu ekwuola na onweghị ihe ezinaụlọ ha ga-eketa n'agidimgba ego eretara na nka nna ya nke e rere na London na nsonso a.
Abalị atọ gara aga, e reela nka Ben Enwonwu sere n'afọ 1974 nke ọ kpọrọ 'Tutu,' otu ijeri dọla nke pụtara nde narị ise na asatọ.
N'ajụjụọnụ onye ntaakụkọ BBC gbara ya n'ekwenti, Enwonwu kwuru na " Ọ bụ ihe mwute na ezinalụlọ ya agagị eketa ihe ọbụla na'egọ ahụ. Ugbua onweghị iwu kwadoro ka ndị nka Naijiria na-enweta ihe nketa ọrụ nka ha.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị nka Naijiria na-agba mbọ ha na ndị ogbo ha ndị mba ojikọ iji hụ na ndị nka ga na-enweta pacent n'ime ihe ere nka dị ka ntị na-eti egwụ ndị nwere ohere irite ihe na nka afọ iri asaa.
Ọ kọwakwara na ọgịga ya na London ebe a nọ re ihe nka ahụ bụ maka nkwanye ukwu e nyere nna ya na ọrụ ya.
Gee ihe ọkpara Ben Enwonwu kwuru na bekee:
Cheta na Ben Enwonwu nwụrụ anwụ bụ onye nka eserese a ma ama.
Ọ gụrụ akwụkwọ na Goldsmiths, Ruskin College, Oxford na Slade art School London na 1940. Tupu Ben Enwonwu a laa mụọ na 1994, ọ bụ ya ka enyere ọrụ ịkpụ Queen Elizabeth mgbe ọ biara Naịjirịa n'afọ 1956.

Ebe foto si, Oliver Enwonwu
Akụkọ ndị ọzọ na-amasị gị:










