Oscars ewepụla 'ejije Naịjirịa' ọzọ na nturuugo ha

Joy

Ebe foto si, Screenshot from movie

Ndị na-ahazị emume nturuugo ejije a kpọrọ Oscars akụpụla ihe nkiri a kpọrọ 'Joy' makana a sụrụ ọtụtụ Bekee n'ime ya.

N'agbanyeghi na Joy bụ ejiji e mere na mba Austria, mana ọ bụ ndị Naịjirịa mere ya dịka ọ bụ maka ụmụafọ Naịjirịa na-agba akwụna na Yurope.

Joy pụtara na mbụ n'emume ihe nkiri a kpọrọ Venice Film Festival n'ọnwa Sepụtemba 2018.

Ọ pụtara nke ọma n'Austria n'ọnwa Janụwarị nke afọ 2019.

Jennifer Davidson bụ onye mgbasaozi na ngalaba a kpọrọ "Academy of Motion Picture Arts and Sciences" - bụ ndị na-ehiwe Oscars - gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na e wepụrụ ejije a.

Ọ sị, "Dịka anyị na-eme n'afọ niile, anyi nọ n'ime enyocha ejije ndị e tinyere n'ogogo "International Feature Film" iji mata ma ha sonyere n'iwu anyị.

"Ejije "Joy", bụ nke mba Austria wetere, dara nyocha makana ọ bụ soso asụsụ pasentị iri atọ na atọ (33%) bụ ihe na-abụghị Bekee n'ime ya."

Na nke nke, ndị na-ahazi Oscars sị na ha wepụrụ ejiji a n'okwe maka Bekee karịrị n'ime ya.

Nke a na-abịa dịka ndị nhazi Oscars wepụrụ 'LionHeart' maka ọtụtụ Bekee a sụrụ n'ime ya.

Ogogo nturuugo a họpụtara ihe nkiri abụọ ndị a (Joy na Lionheart) bụ nke a kpọrọ "Best International Feature".

Ogogo a bụ maka ihe nkiri e ji asụsụ na-abụghị Bekee mee.

Aha onyonyo, 'Gbanwenu usoro esi eme ihe nkiri ụgbụa'