You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
AMAA 2019: Ọgọdọ ụmụnwaanyị sụ wuchie n'AMAA 2019
Ọ bụghị naanị akụkọ ndị meriri n'emume Africa Movie Academy Awards (AMAA) e mere n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọktoba pụtara.
Ụmụnwaanyị bịara ya bụ emume sụụ ọgọdọ mere ka ndị mmadụ kpụrụ ha n'ọnụ ruo agwụ agwụ.
Lekwa ụfọdụ n'ime ha na ọgọdọ ha sụ:
Belinda Effah
Ebe Belinda Effah bụ onye ihe nkiri ritere nturuugo AMAA n'afọ 2012 wuchiri n'emume ahụ n'uwe nke ya na-acha ọbara ọbara.
Hilda Dokubo
Uwe Hilda Dokubo suu bịa emume a mere ya ka ọ dịka nwa agbọghọ a ka na-achọ ịlụta ọhụrụ.
Ihuoma Ejiofor-Suleiman
Ihuoma Ejiofor onye ritere nturugo a n'afọ 2013 agbajọghị ndị nso nso ya agbanyeghị na ọ ka lụchara di nso nso a.
Esther Agunbiade
Esther nke Big Brother Naịja emepụrụ na nso nso a sụ uwe mere ka ndị mmadụ kpọwa ya ose na-acha anụnụ anụnụ.
Sola Shobowale
Lekwanu Sola Shobowale ka ọ dị ka nwa sisi a ka na-akpa nganga.
Etu nwaanyị a si eme ihe nkiri nke ya na-enyekarị ndị mmadụ ọṅụ pụrụiche.
O nwekwara ike ịbụ ya kpatara o ji nwete nturuugo ọkachaibe dịka onye nkiri mekarịchara ọfụma na ihe nkiri "King of Boys".
Afọ 2019 ga-eme ya afọ iri na ise a na-eme ya bụ emume.