You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu first lady: Monica Ugwuanyị agbapeela akụrụngwa e ji akwọ aka
Iji were sonye mba ụwa niile na mmemme ejị akwọchapụ aka nke ọma, a kpọrọ "Global hand washing day" nwunye gọvanọ Enugwu bụ Monica Ugwuanyị gbapere ihe ejị akwọ aka n'ụlọakwụkwọ Amechi prịmarị n'Enugwu.
BBC Igbo garuru ya bụ ụlọakwụkwọ n'Amechi dị n'Enugwu south LGA iji hụ ka ụmụ akwụkwọ sị eji ya bụ akụrụngwa akwọ aka.
Otu onye nkuzi gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ụmụaka ji aka ha rụọ ya bụ ngwa ọrụ.
Ha bupụtara osisi, galọnụ, eriri, ncha, kedo ya ma gosi anyị ka e si akwọ aka.
Mana onye nkuzi onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ kọwara na ihe mere ha jiri wepụsịa ya bụ osisi a kụrụ bụ n'ihi na o sighi ike n'ala nke mere na ụmụakwụkwọ na akwatu ya.
Ya bụ ihe e ji akwọ aka nke dịbu n'akụkụ anọ na ya bụ ụlọakwụkwọ adịghịzị ebe ha kwesịrị.
Ụmụntakịrị ahụ bupụtara osisi, galọnụ, eriri, ncha, kedo ya ma gosi anyị ka esi akwọ aka.
Onye nkuzi BBC Igbo gakwụrụ ebe ahụ gwara anyị na ọ bụrụ na gọmenti ga arụrụ ha akụrụngwa ọgbara ọhụrụ eji akwọ aka, na ọ ga-abara ha uru nke ukwuu karia nke gbanụ gbanụ a ha jị eriri ekedo.
Ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya
Nwaada a sị na obi adịghi ya mma maka mgbape a nwunye Gọvanọ mere
@TeeHotSpot kwukara na obi adịghị ya mma.