You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Sky B Death Rumour: Adị m ndụ, anwụbeghị m
Onye otiegwu e ji 'Sky B' mara ekwuola na akụkọ gbasara ọnwụ ya bụ asị.
Akụkọ malitere iwu na soshal midia abalị abụọ gara aga na-ekwu na Sky B nwụrụ mgbe ọrịa obi gbuturu ya.
Ọtụtụ ụlọ ntaakụkọ a ma ama buru ya bụ akụkọ.
Mana onye nlekọta Sky B bụ Saint Opara gwara BBC Igbo n'ekwentị n'ụbọchị Tọọzdee na akụkọ ahụ abụchaghị eziokwu.
O kwuru na Sky B nwere ọrịa obi nke buturu ya n'ụbọchị Tuzde nke mere ka e buru ya gbaga ụlọọgwụ.
Opara kwuru na mgbe e bugara ya ụlọọgwụ, "dọkịta kwuru na Sky B nwere ike ịnwụ mana o mechara gbakee."
"Ọ sila n'ụlọọgwụ laa kamgbe ụnyaahụ (Wenezde)."
Sky B dekwara ihe n'akara 'instagram' ya na-akọwa ihe mere ya.
Ọ rịọrọ ndị mmadụ ka ha kwụsị ike akụkọ maka ọnwụ ya kama ka ha kee akụkọ maka egwu ya.
Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na Sky B kpacha anya malite akụkọ maka ọnwụ ya.
Ha kwuru na o mere nke ahụ iji kwalite egwu ọhụrụ o tiri.
Ndị ọzọ kwuru na o mere ya ka aha ya wee wuo ewu.
Kedukwanu onye malitere asịrị a na Sky B anwụọla?
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: