Komla Dumor Award 2019: Onye Uganda amaburula ya bụ nturugo

Onye ntaakụkọ Yuganda bụ Solomon Serwanjja eritela nturugo Komla Dumor 2019 nke BBC hibere.
Serwanjja bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ mgbasa ozi akpọrọ 'NBS TV' ebe o na-eme otu ihe ngosi na-ewu ewu.
O mepụtala akụkọ dị icheiche nwetere ihe nrite ma nke o mepụtara ngalaba akpọrọ 'BBC Africa eye' gbasara ire ọgwụ gọọmenti wepụtara ka-ejiri gwọ ndị mmadụ na nkịtị.
Nturugo a malitere kamgbe afọ 2014, iji wee kwanyere onye ntaakụkọ BBC bụ Komla Dumor nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri anọ na atọ, n'afọ 2014.
Serwanjja bụ onye nke ise na-erite ya bụ nturugo dịka Waihiga Mwaura, Amina Yuguda, Didi Akinyelure nakwa onye Yuganda Nancy Kacungira ibe ya ritegoro ya.
Nturugo a gunyere ya ị ga-anọdụ n'isi ụlọrụ BBC dị na mba UK , ma mecha gaa Yuganda gaa mee akụkọ ga-ewu ewu.
Serwanja gbara mbọ me ka ndị ọkaikpe na-enyocha ndị na-azọ nturugo a ghọta atụghị ụjọ n'iwepụta akụkọ ọbụla bụ nke ga-enye ọha aka.
Onyeisi 'BBC World Service Group' bụ Jamie Angus kwuru na ntụrụgo a bụ nke eji akwanyere Komla ugwu dị BBC ezigbo mkpa.











