You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Stanley Nwabia: Ihe na-ewute ndị mmadụ maka ọnwụ nwoke a
Stanley Nwabia, onye a ma ama n'elu Twitter anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri anọ na atọ.
Ndị ezinụlọ ya kwuru na ọ nwụrụ n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị ụka bụ 29 Sepụtemba mgbe usoro e ji etinye ọbara n'ahụ ya agaghị nke ọma dịka ụlọọrụ mgbasa ozi 'Premium Times' si depụta.
Ụfọdụ ndị enyi ya ekwupụtala na Twitter maka ọnwụ ya ma na-eto ya etu o si bụrụ ọnụ na-ekwusike maka etu ndọrọndọrọ ọchịchị si aga na Naịjirịa.
Ihe ndị eji mara Stanley Nwabia mgbe ọ dị ndụ
- O na-eji akara Twitter ya akatọ ndọrọndọrọ ọchịchị na-ezighị ezi.
- Ọ na-akwadokarị pati 'Peoples Democratic Party' n'akara twitter ya (@MrStanleyNwabia).
- Ọ na-akatọkarị otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-achị Naịjịra ugbua bụ 'All Progressive Congress' nke mere ndị mmadụ kwunyere pati a na-agwakarị ya okwu ọjọ.
- Ọ bụ onye Abia Steeti mana a mụrụ ya na Lagos.
- O nwere otu nwunye mụtaara ya ụmụ anọ.
Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu na Twitter maka ọnwụ ya
Onye bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa , Atiku Abubakar kwuru na o na-ekele Nwabia maka etu o si kwado pati PDP mgbe ọ dị ndụ.
@gentleojay na-ekwu na ọ bụ ọrịa gburu nwa amadi a
@TosinOlugbenga kwuru onye amamihe nke ukwuu anwụọla.
@UchePOkoye na-eto Nwabia maka etu o si ewepụ ụjọ ma kwuo ihe kwesiri ka ekwuo.
@MrOdanz kwuru na ọnwụ Nwabia gbawara ya obi.