You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Everton vs Manchester City: Man City abịala be Everton biagbuo ha
Igbo na-atụ ilu sị ọ bịara be onye abịagbula ya mana nke a abụghị maka ndị otu eguw bọọlụ Manchester City.
Ha bịara be ndị Everton n'ụbọchị Satọdee ma bịagbuo ha.
Ọkpụ goolu atọ asatara otu ka Man City ji wee kuziere Eveton ihe.
Gabriel Jesus bụ onye izizi nyere goolu mgbe o fere ka nnụnụ were isi makpuo bọọlụ Kevin De Bruyne gbaara ya.
Oteghị aka, Dominic Calvert-Lewin sara goolu ahụ.
Mana Riyad Mahrez mekwara ka o si eme mgbe o gbakpuru 'free-kick' ndị Man City nwetara.
Goolu a Mahrez nyere yiri goolu o nyere mgbe mba Ọljiria dulara Naịjiria n'asọmpi iko mba Afrịka afọ a.
Raheem Sterling mechara nyekwa otu goolu iji mezuo ya atọ.
Nke ka njọ bụ na nwaafọ Igbo bụ Alex Iwobi agbataghị ọnụ ya n'asọmpi ahụ.
E tinyere Iwobi n'asọmpị a na nkeji nke anọ mgbe Theo Walcot merụrụ ahụ.
Mana e wepukwara Iwobi na nkeji 74.
Mmeri a mere ka Man City kwụsie ike dịka ndị nke abụọ na tebulu 'English Premier League'.
Cheta na Liverpool ji naanị otu ọkpụ goolu merie ndị Sheffield United n'ehihie Satọdee.
Chelsea meriri Brighton 2-0, Tottenham meriri Southampton 2-1, ebe Wolves meriri Watford 2-0.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: